Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Chere na Ọ Bụ Naanị Ha Ka A Ga-azọpụta?

Ndịàmà Jehova Hà Chere na Ọ Bụ Naanị Ha Ka A Ga-azọpụta?

 Mba. Ọtụtụ nde mmadụ ndị biri ndụ ọtụtụ afọ gara aga abụghị Ndịàmà Jehova. Ma, ha nwere ike iso ná ndị a ga-azọpụta. Baịbụl kwuru na n’ime Alaeze Chineke, a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ Ndịozi 24:15) Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ ndị nọ ndụ taa nwekwara ike bido ife Chineke, ha esoro ná ndị a ga-azọpụta. Ma, ọ bụghị anyịnwa ka ọ dị n’aka ikwu onye a ga-azọpụta na onye a na-agaghị azọpụta. Ọ bụ Jizọs ka ọ dị n’aka.—Jọn 5:22, 27.