Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Baịbụl ọ̀ bụ Okwu Chineke?

Okwu Chineke kwesịrị ịbụ akwụkwọ pụrụ iche. Ọ́ bụghị ya? N’eziokwu, Baịbụl pụrụ iche. E bipụtala ya ihe ruru ọtụtụ narị ijeri, e nwekwara ya n’ọtụtụ narị asụsụ. Baịbụl nwere ike ịgbanwe ndụ ndị mmadụ, mee ka ha kpawa àgwà ọma.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13; 2 Timoti 3:16.

Obi siri anyị ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’ihi na o kwuo na ihe ga-eme, ihe ahụ na-emecha mee. O nweghị mmadụ ọ bụla na-ekwu ihe ga-eme echi, ihe ahụ emee otú ahụ o kwuru ya. Ma, ihe ọ bụla e kwuru na Baịbụl na-emerịrị otú e kwuru ya. Dị ka ihe atụ, e nwere akwụkwọ Aịzaya a hụrụ n’otu ọgba dị nso n’osimiri a na-akpọ Osimiri Nwụrụ Anwụ. E dere akwụkwọ ahụ ihe karịrị otu narị afọ tupu a mụọ Jizọs. Akwụkwọ ahụ kwuru na a ga-ebibi obodo Babịlọn, nakwa na o nweghị onye ga-ebi na ya. Ihe ahụ o kwuru mechara mezuo. O mezuru ọtụtụ afọ Jizọs kwusachara ozi ọma n’ụwa.—Gụọ Aịzaya 13:19, 20; 2 Pita 1:20, 21.

Olee otú e si dee Baịbụl?

Ọ bụ ihe dị ka mmadụ iri anọ dere Baịbụl. O were ha ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ isii tupu ha edechaa ya. Ihe onye nke ọ bụla n’ime ha dere dabara n’ihe ibe ya dere. Gịnị mere ha ji nwee ike ide ya otú ahụ? Ọ bụ maka na Chineke ji mmụọ nsọ ya nyere ha aka.—Gụọ 2 Samuel 23:2.

Mgbe ụfọdụ, Chineke si n’aka ndị mmụọ ozi gwa ndị ahụ dere Baịbụl ihe ha ga-ede. O nwekwara mgbe ọ gwara ha okwu n’ọhụụ nakwa ná nrọ. Ma, otú Chineke si gwa ọtụtụ n’ime ha ihe ha dere bụ na o mere ka ha mata ihe ha kwesịrị ide, ya ahapụzie ha ka ha jiri aka ha dee ya otú ndị mmadụ ga-aghọta ya.—Gụọ Mkpughe 1:1; 21:3-5.