Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ GA-ADỊLI NDỤ ỌZỌ?

Olee Ihe Ga-eme Ka Obi Sie Gị Ike na Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Olee Ihe Ga-eme Ka Obi Sie Gị Ike na Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Ọ bụrụ na mmadụ asị na ya kweere na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, ànyị kwesịrị iwere na onye ahụ amaghị nke a na-akọ? Pọl onyeozi echeghị otú ahụ. O si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ọ bụrụ naanị ná ndụ a ka anyị nwere olileanya na Kraịst, anyị bụ ndị e kwesịrị imere ebere karịa mmadụ niile. Ma, ugbu a, e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, bụ́ mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:19, 20) Obi siri Pọl ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Mkpọlite a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ mere ka obi sie anyị ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. * (Ọrụ Ndịozi 17:31) Ọ bụ ya mere Pọl ji kpọọ Jizọs “mkpụrụ mbụ.” Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ, ya enweta ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na Jizọs bụ onye mbụ, ọ pụtara na a ga-enwe ndị ọzọ.

Job gwara Chineke, sị: “Agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.”Job 14:14, 15

Ihe ọzọ mere ị ga-eji kwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ bụ n’ihi na Jehova bụ Chineke nke eziokwu. ‘Chineke apụghị ịgha ụgha.’ (Taịtọs 1:2) Jehova aghatụbeghị ụgha mbụ, o mekataghịkwa ghaa ụgha. Chineke ọ̀ ga-asị na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, gosikwa na ọ ga-emeli ya, mechazie hapụ ime ya? O doro anya na o mekataghị mee ụdị ihe ahụ.

Gịnị mere Jehova ji chọọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Job jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” Ọ gwakwara Jehova, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” (Job 14:14, 15) Obi siri Job ike na ya nwụọ, ọ ga-agụsi Nna ya nke eluigwe agụụ ike ịkpọlite ya. Chineke ọ̀ gbanweela? Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.” (Malakaị 3:6) Ọ ka na-agụsi Chineke agụụ ike ka a kpọlite ndị nwụrụ anwụ, ahụ́ esie ha ike, ha ana-enwekwa obi ụtọ. Ọ bụkwa otú a ka ọ na-adị nne ma ọ bụ nna ma nwa ya nwụọ. Ma, ihe dị iche bụ na Chineke ga-emeli ihe ọ bụla na-agụ ya agụụ ime.—Abụ Ọma 135:6.

Ọnwụ na-akpatara anyị obi mgbawa, ma Chineke ga-eme ka ọ gharazie ịdị

Jehova ga-enye Ọkpara ya ike ọ ga-eji kpọlite ndị nwụrụ anwụ, sí otú ahụ mee ka ndị ha na-eru uju nwewezie aṅụrị. Ma, ọ̀ na-agụdị Jizọs agụụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? Tupu Jizọs akpọlite Lazarọs, “anya mmiri gbara” ya mgbe ọ hụrụ ka ụmụnne Lazarọs na ndị enyi Lazarọs na-akwa ákwá. (Jọn 11:35) E nwekwara mgbe Jizọs hụrụ otu nwaanyị Nen di ya nwụrụ ka ọ na-akwa ákwá n’ihi na otu nwa nwoke o nwere nwụrụ. Jizọs “nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ, . . . wee sị ya: ‘Kwụsị ịkwa ákwá.’” Ozugbo ahụkwa, ọ kpọlitere nwa ya nwoke ahụ. (Luk 7:13) Ihe ndị a niile gosiri na ọnwụ na uju ndị mmadụ na-eru na-ewute Jizọs. Obi ga-atọgbu ya atọgbu mgbe ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, mezie ka ndị ha na-eru uju ṅụrịwa ọṅụ n’ụwa niile.

Ò nwetụla mgbe ọnwụ mmadụ gbawara gị obi? I nwere ike ịna-eche na o nweghị ihe ga-eme ka ị hụ onye ahụ ọzọ. Ma, i nwere ike ịhụ ya ọzọ n’ihi na Chineke ga-esi n’aka Ọkpara ya kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Chineke chọrọ ka ị hụ mgbe ihe a ga-eme. Ọ chọrọ ka ị hụ mgbe a ga-akpọlite onye ahụ nwụnahụrụ gị, gị amakụọkwa ya. Chegodị ihe ọ ga-adị ka ya mgbe ọnwụ na-agaghịzi ekewa unu, unu ana-emekọ ihe ọnụ ruo mgbe ebighị ebi.

Lionel, onye anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu mbụ dị n’akwụkwọ a, kwuru, sị: “Emechara m mata na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Mgbe mbụ m nụrụ ya, ọ daghị m ka ihe nwere ike ime eme, ewereghịkwa m onye gwara m ya ka onye ga-amali eziokwu gbasara ụdị ihe a. Ma, m matara na ọ bụ eziokwu mgbe m hụrụ ya na Baịbụl. M na-atụsizi anya ike ịhụ papa nnukwu m ọzọ.”

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu gbasara mbilite n’ọnwụ? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ iji Baịbụl gị gosi gị ihe mere obi ji sie ha ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. *

^ para. 3 Ị chọọ ịmata ihe ndị gosiri na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, gụọ Ụlọ Nche Eprel 1, 2012, peeji nke 7. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 9 Biko, gụọ isi nke 7 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.