Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe ndị siiri Herọd ike mgbe ọ na-arụghachi ụlọ nsọ dị́ na Jeruselem?

Mgbe Sọlọmọn rụrụ ụlọ nsọ Jeruselem, ọ rụrụ ya n’elu ugwu ma jiri mgbidi gbaa ya ogige ma n’ebe ọwụwa anyanwụ ma n’ebe ọdịda anyanwụ nke ugwu ahụ. Ọ rụrụ ya ya e nwee steepụ ndị dị gburugburu ụlọ nsọ ahụ. Ma, Herọd chọrọ ka ụlọ nsọ ahụ maa mma karịa otú Sọlọmọn si rụọ ya. Ọ bụ ya mere o ji malite ịrụgharị ya na ime ka o bukwuo ibu.

Ndị ọrụ Herọd rụgharịrị ụlọ nsọ ahụ, mee ka ala dị́ n’ebe ugwu ụlọ nsọ ahụ sakwuo mbara, rụnyekwuokwa steepụ na ya. N’ebe ndịda ụlọ nsọ ahụ, ha mere ka ebe ikpo okwu sakwuo mbara, rụnyekwuo ihe ruru mita iri atọ na abụọ na ya. Ma, ha bu ụzọ rụọ mgbidi ndị siri ezigbo ike gburugburu ụlọ nsọ ahụ. Mgbidi ndị ahụ nwekwara ebe ndị e ji nkume rụọ ihe ndị nwere oghere e nwere ike isi na ha gafere. Ha rụgidere mgbidi ahụ ogo ya eruo mita iri ise.

Herọd gbara mbọ ka ihe ọ na-arụ ghara ịkpasu ndị Juu iwe ma ọ bụ nye ndị na-eje ozi ma ọ bụ ndị na-achụ àjà n’ụlọ nsọ ahụ nsogbu. Onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru na Herọd kụzidịịrị ndị nchụàjà ndị Juu otú e si eji nkume edo ụlọ, kụziekwara ha ịkwa nkà, ka onye na-erughị eru ịbanye n’ebe ndị e doro nsọ ghara ịga ebe ahụ rụọ ọrụ.

Herọd nwụrụ tupu a rụgharịchaa ụlọ nsọ ahụ. Malite mgbe Herọd bidoro ịrụgharị ya ruo n’afọ 30 Oge Ndị Kraịst, afọ iri anọ na isii agaala. (Jọn 2:20) Ọ bụzi nwa nwa Herọd, bụ́ Agrippa nke Abụọ, rụgharịchara ya n’ihe dị ka n’afọ 50 Oge Ndị Kraịst.

Gịnị mere ndị Mọlta ji chee na Pọl onyeozi bụ ogbu ọchụ?

Ebe chi nwaanyị na-ekpe ikpe ziri ezi (ọ bụ ya nọ n’aka ekpe) na-eti chi nwaanyị na-ekpe ikpe mkpegbu ihe

O nwere ike ịbụ n’ihi na ụfọdụ ndị Mọlta na-ekpe okpukpe ndị Grik. Ka anyị leba anya n’ihe a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gbasara mgbe ụgbọ mmiri Pọl hà ji eme njem kpuru na Mọlta. Mgbe ha si ná mmiri ahụ pụta, ndị Mọlta kwanyeere ha ọkụ maka oyi na-atụ ha. Ma, mgbe Pọl buuru otu ùkwù nkụ tụkwasị n’ọkụ ahụ, otu ajụala pụtara ma gbakụọ ya n’aka. Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ ihe a, ha sịrị: “N’ezie, nwoke a bụ ogbu ọchụ, ọ bụ ezie na o si n’oké osimiri pụta n’enweghị ihe mere ya, ahụhụ kwesịrị ihe o metara ekweghị ka ọ dịrị ndụ.”Ọrụ Ndịozi 28:4.

Okwu Grik a sụgharịrị “ahụhụ kwesịrị ihe o metara” bụ “di’ke.” Okwu a pụtakwara ikpe ziri ezi. Ma n’akụkọ ifo ndị Gris, Dike bụ aha ha na-akpọ chi ha bụ́ chi nwaanyị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ha chere na ọ bụ ya na-ahụ maka ihe gbasara ụmụ mmadụ. E nwee onye megburu ibe ya, ma, ndị ọzọ amaghị gbasara ya, Dike na-akọrọ chi ọzọ a na-akpọ Zus, ka e nwee ike ịta onye ahụ ahụhụ. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ ji kwuo na ọ ga-abụ na ndị Mọlta nọ na-eche na ‘n’agbanyeghị na Pọl ­lanahụrụ ọnwụ n’ókè osimiri ahụ, Dike bụ́ chi nwaanyị ahụwala ya ama maka ihe ọjọọ o mere, na-achọkwa ugbu a iji ajụala memilaa ya.’ Ma, ndị Mọlta gbanwere obi ha mgbe ha hụrụ na o nweghị ọkọ kọrọ Pọl.