Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Bụrụ Onyeàmà Jehova?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Bụrụ Onyeàmà Jehova?

 Jizọs kwuru ihe onye chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova ga-eme. Ihe o kwuru dị na Matiu 28:19, 20. Ebe ahụ kwuru ihe mmadụ kwesịrị ime ka o wee bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst. Otu n’ime ha bụ na onye ahụ ga na-agbara Jehova àmà ma ọ bụ na-agwa ndị ọzọ banyere ya.

 Ihe nke mbụ: Mụta ihe Baịbụl na-akụzi. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, zieekwa ha ihe.’ (Matiu 28:19, 20) Okwu e si sụgharịta ‘onye na-eso ụzọ’ pụtara “onye na-amụ ihe.” Ihe ndị dị na Baịbụl, karịchaa ihe ndị Jizọs kụziri, ga-enyere mmadụ aka ibi ezigbo ndụ ma na-enwe obi ụtọ. (2 Timoti 3:​16, 17) Ndịàmà Jehova na-aga na nke ndị mmadụ akụziri ha ihe Baịbụl na-ekwu. Ha ga-achọkwa ịbịa nyere gị aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi.​—Matiu 10:​7, 8; 1 Ndị Tesalonaịka 2:​13.

 Ihe nke abụọ: Na-eme ihe ndị ị na-amụta. Jizọs kwuru na ndị na-amụ Baịbụl kwesịkwara ịna-edebe ihe niile o nyere n’iwu. (Matiu 28:20) Ọ pụtara na ị gaghị na-amụ Baịbụl naanị iji mụta ihe ọhụrụ, kama ihe ị na-amuta kwesịrị ime ka ị gbanwee otú i si eche echiche na otú i si akpa àgwà. (Ọrụ Ndịozi 10:42; Ndị Efesọs 4:​22-​29; Ndị Hibru 10:24, 25) Ndị na-erubere iwu Jizọs isi na-ejizi obi ha niile kpebie inyefe Jehova Chineke onwe ha ma bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.​—Matiu 16:24.

 Ihe nke atọ: A ga-eme gị baptizim. (Matiu 28:19) Na Baịbụl, e ji ime baptizim tụnyere ili mmadụ. (Tụlee Ndị Rom 6:​2-4.) Ime mmadụ baptizim na-egosi na onye ahụ anwụọla n’ụdị ndụ ọ na-ebibu ma malite ibi ndụ ọhụrụ. I mee baptizim, ọ pụtara na ị na-agwa ndị ọzọ na i meela ihe abụọ mbụ ahụ Jizọs kwuru nakwa na ị na-arịọ Chineke ka o mee ka i nwee akọnuche dị ọcha.​—Ndị Hibru 9:​14; 1 Pita 3:​21.

Olee otú m ga-esi mata ma m̀ ruola ime baptizim?

 Gwa ndị okenye ọgbakọ ị nọ na ya. Gị na ha ga-ekwurịta okwu ka ha mata ma ị̀ ghọtara ihe ime baptizim pụtara, ma ị̀ na-eme ihe ndị ị mụtara nakwa ma ì jirila obi gị niile nyefee Chineke onwe gị.​—Ọrụ Ndịozi 20:28; 1 Pita 5:​1-3.

Onye nne na nna ya bụ Ndịàmà Jehova ọ̀ ga-emecha ihe ndị a niile?

 Ee. Anyị na-azụ ụmụ anyị ka ha na-efe Jehova otú ahụ Baịbụl nyere anyị n’iwu. (Ndị Efesọs 6:4) Ma, ka ha na-etolite, ọ bụ ha ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-amụ Baịbụl, ma hà ga-ekwere ihe ha mụtara nakwa ma hà ga-eme ihe Baịbụl kwuru tupu ha eruo eru ime baptizim. (Ndị Rom 12:2) Mee elu mee ala, onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie onye ọ ga-efe.​—Ndị Rom 14:12; Ndị Galeshia 6:5.