Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs 4:1-32

  • Otú ahụ́ Kraịst si dịrị n’otu (1-16)

    • Ụmụ nwoke e ji nye onyinye (8)

  • Àgwà ọjọọ mmadụ na-akpabu na àgwà ọma (17-32)

4  N’ihi ya, mụnwa a tụrụ mkpọrọ+ maka Onyenwe anyị na-arịọ unu ka unu na-eje ije otú kwesịrị+ òkù ahụ a kpọrọ unu.  Dịrịnụ umeala n’obi.+ Na-adịnụ nwayọọ mgbe niile. Na-enwenụ ndidi.+ Na-edirinụ ibe unu ihe n’ihi na unu hụrụ ha n’anya.+  Unu na ibe unu dịrị n’udo, na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka unu dịrị.+  E nwere otu ahụ́,+ nweekwa otu mmụọ nsọ,+ otú ahụ e nwere otu olileanya+ a kpọrọ unu ka unu nwee.  E nwekwara otu Onyenwe anyị,+ otu okwukwe, otu baptizim,  otu Chineke na Nna mmadụ niile, onye bụ́ onyeisi mmadụ niile na onye na-esi n’aka mmadụ niile arụ ọrụ, na-ejikwa ike ya arụ ọrụ n’ime mmadụ niile.  Chineke meere onye ọ bụla n’ime anyị amara. Ọ bụ ya mere Kraịst ji nye anyị niile onyinye dị iche iche n’efu.+  N’ihi na Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Mgbe ọ rịgooro n’elu, ọ kpọọrọ ụmụ nwoke a dọọrọ n’agha, jiri ha nye onyinye.”+  Ma gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ọ rịgooro” pụtara? Ọ pụtara na e nwere mgbe ọ rịdatara n’ụwa. 10  Onye ahụ rịdatara n’ụwa bụkwa ya rịgooro+ ebe dị elu karịa eluigwe niile,+ ka o wee mezuo ihe niile. 11  O nyere ụfọdụ ka ha bụrụ ndịozi,+ nye ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,+ nye ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma,+ nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị na-akụzi ihe,+ 12  ka ha na-agbazi* ndị nsọ, na-eje ozi, na-emekwa ka ahụ́ Kraịst sie ike.*+ 13  Ha ga na-eme ihe ndị a ka anyị niile kwere otu ihe, marakwa Ọkpara Chineke nke ọma. Anyị ga-esi otú ahụ bụrụ ndị dimkpa,+ tozuokwa okè ka Kraịst. 14  N’ihi ya, anyị ekwesịghịzi ịbụ ụmụaka, maka na ọ bụrụ na mmadụ ekwere ihe na-abụghị eziokwu ndị aghụghọ na-akụzi,+ onye ahụ yiri ụgbọ dị n’oké osimiri nke ifufe na ebili mmiri na-ebugharị. 15  Kama ka anyị na-ekwu eziokwu, ka ịhụnanya mee ka anyị tozuo etozuo n’ụzọ niile, na-ebikwa ndụ otú Kraịst bụ́ onyeisi anyị biri.+ 16  E si n’aka ya jikọọ ahụ́+ niile ọnụ nke ọma, ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-enyekwara ibe ya aka ịrụ ọrụ ya otú ga-abara ahụ́ niile uru. Ọ bụrụ na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-arụ ọrụ ya nke ọma, ahụ́ ga na-eto eto, gbasiekwa ike n’ihi na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ hụrụ ibe ya n’anya.+ 17  N’ihi ya, ihe m ji aha Onyenwe anyị na-agwa unu ma na-agba unu ume bụ ka unu kwụsị ịna-eje ije otú ndị mba ọzọ na-eje,+ n’ihi na ha na-ebi ndụ otú echiche ha na-abaghị uru na-agwa ha.+ 18  Uche ha gbara ọchịchịrị, ha enweghịkwa olileanya ịdị ndụ Chineke ga-eme ka anyị dịrị, n’ihi na ha amaghị ihe, ihe anaghịkwa emetụ ha n’obi.* 19  Ebe ọ bụ na mmehie ha anaghịzi ewute ha, ha wepụtara onwe ha na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ jirikwa anyaukwu na-eme ụdị omume niile na-adịghị ọcha. 20  Ma unu ma na Kraịst adịghị otú ahụ, 21  ebe ọ bụ na unu nụrụ ihe o kwuru, a kụzikwaara unu eziokwu ọ kụziri. 22  A kụziiri unu ka unu yipụ àgwà* ochie unu+ n’ihi na ha rụrụ arụ, ọ bụkwa ọchịchọ unu duhiere unu.+ 23  Unu kwesịkwara ịna-eme ka otú unu si eche echiche dị ọhụrụ,*+ 24  kwesịkwa iyiri àgwà* ọhụrụ+ nke Chineke chọrọ. Àgwà ọhụrụ a pụtara ezi omume na ịkwụsi ike n’ihe ziri ezi. 25  N’ihi ya, ebe unu hapụrụla aghụghọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu,+ n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.+ 26  Weenụ iwe, ma unu emehiela.+ Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.+ 27  Unu enyekwala Ekwensu ohere.+ 28  Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama, ka ọ na-arụsi ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ dị mma,+ ka o wee nwee ihe ọ ga-enye onye nọ ná mkpa.+ 29  Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,+ kama, na-ekwunụ naanị okwu dị mma n’oge dabara adaba, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike.+ 30  Unu adịkwala na-eme ihe ga-ewute mmụọ nsọ Chineke.+ Ọ bụ ya ka e ji kaa unu akara+ maka ụbọchị a ga-eji ihe mgbapụta gbapụta unu.+ 31  Kwụsịnụ inwe ụdị obi ilu+ ọ bụla, iwe, ọnụma, iti mkpu, ịkparị mmadụ,+ na ihe ọjọọ niile.+ 32  Ma na-enwerenụ ibe unu obiọma, na-enwekwanụ obi ebere.+ Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-azụ.”
Na Grik, “na-ewuli ahụ́ nke Kraịst elu.” Ahụ́ Kraịst a na-ekwu bụ ọgbakọ ya.
Na Grik, “obi ha anaghịkwa arụ ọrụ.”
Ma ọ bụ “ime ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “mmadụ.”
Ma ọ bụ “ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ.” Na Grik, “ka unu dị ọhụrụ na mmụọ nke uche unu.”
Na Grik, “mmadụ.”