Gaa n'Isiokwu

Ihe Mere Ndịàmà Jehova Ji Aga Ozi Ọma Ọ̀ Bụ Ka E Jiri Maka Ya Zọpụta Ha?

Ihe Mere Ndịàmà Jehova Ji Aga Ozi Ọma Ọ̀ Bụ Ka E Jiri Maka Ya Zọpụta Ha?

 Mba. Ọ bụ eziokwu na anyị na-aga ozi ọma mgbe niile, anyị ma na ọ bụ n’ihi amara Chineke ka a ga-eji zọpụta anyị. (Ndị Efesọs 2:8) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

 Weregodị ya na otu nwoke bụ́ ezigbo mmadụ kwuru ụbọchị ọ chọrọ ka onye ọ bụla bịa n’otu ebe ka o nye ha onyinye. Ọ bụrụ na i kwetara na nwoke ahụ ga-eme ihe o kwuru, ọ̀ bụ na ị gaghị aga? Anyị ma na ị ga-aga. I nwedịrị ike ịkọrọ ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị gbasara ya, ka ha gaakwa nweta onyinye nke ha. Ị gagodị ebe ahụ, nwoke ahụ enye gị onyinye, ọ pụtaghị na onyinye ahụ bụ maka ije ị gara rute ebe ahụ. Ọ bụ nwoke ahụ ji obi ya niile chọọ inye gị ya.

 Otú ahụ ka ọ dị Ndịàmà Jehova. Ha kwetara na Chineke ga-enye ndị niile na-erubere ya isi ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 6:23) Anyị na-agba mbọ akọrọ ndị ọzọ ihe anyị kweere ka ha sorokwa ná ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ma, anyị eweereghị ya na anyị na-agata nzọpụta n’ozi ọma. (Ndị Rom 1:17; 3:28) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye ga-emetali ihe Chineke ga-eji zọpụta ya. Baịbụl sịrị na Chineke “zọpụtara anyị. Ọ bụghị n’ihi ezi ọrụ ndị anyị rụrụ, kama, ọ bụ site n’ebere ya.”—Taịtọs 3:5, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.