Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Aga n’Ụlọ Ndị Mmadụ Ezi Ha Ozi Ọma?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Aga n’Ụlọ Ndị Mmadụ Ezi Ha Ozi Ọma?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (Matiu 28:19, 20) Mgbe Jizọs na-ezipụ ndịozi iri na abụọ ya, ọ gwara ha ka ha gakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha. (Matiu 10:7, 11-13) Mgbe Jizọs nwụchara, Ndị Kraịst e nwere n’oge ahụ nọkwa na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma “n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” (Ọrụ Ndịozi 5:42; 20:20) Anyị na-eme ihe ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. Anyị achọpụtakwala na ịgakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha bụ otú magburu onwe ya anyị ga-esi nweta ndị anyị ga-ezi ozi ọma.