Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị

 Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas bụ maka na ha ekweghị na Jizọs.

 Nke bụ́ eziokwu: Anyị bụ Ndị Kraịst. Anyị kweere na ọ bụ naanị n’aka Jizọs Kraịst ka a ga-esi zọpụta anyị.—Ọrụ Ndịozi 4:12.

 Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ndịàmà Jehova na-akpata ọgba aghara n’ezinụlọ n’ihi na ha na-agwa ndị òtù ha agbala Krismas.

 Nke bụ́ eziokwu: Anyị ejighị ezinụlọ egwu egwu, anyị na-ejikwa Baịbụl eme ka ezinụlọ dị iche iche na-ebi n’udo.

 Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ihe ya na ịgba Krismas na-eso, ya bụ, inye onyinye, ikwu ka e nwee udo n’elu ụwa, na ime amara, na-efunahụ unu.

 Nke bụ́ eziokwu: Anyị na-agbalị emesapụ aka, na-emekwa udo kwa ụbọchị. (Ilu 11:25; Ndị Rom 12:18) Dị ka ihe atụ, otú anyị si enwe ọmụmụ ihe anyị na otú anyị si ekwusa ozi ọma dabara n’ihe Jizọs kwuru, nke bụ́, “unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ihe ọzọkwa bụ na anyị na-agwa ndị mmadụ na ọ bụ Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee ezigbo udo n’ụwa.—Matiu 10:7.

Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas?

  •   Jizọs nyere anyị iwu ka anyị na-echeta ọnwụ ya, ọ bụghị ọmụmụ ya.—Luk 22:19, 20.

  •   Ndịozi Jizọs na ndị mbụ soro ụzọ Jizọs agbaghị Krismas. Otu akwụkwọ a na-akpọ New Catholic Encyclopedia sịrị na “ọ bụ malite n’afọ 243 gawa ka e mewere oriri maka ọmụmụ Kraịst.” Ọ pụtara na e bidoro ime ya, ihe karịrị otu narị afọ onyeozi ikpeazụ Jizọs nwụchara.

  •   E nweghị ihe gosiri na ọ bụ n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba ka a mụrụ Jizọs. Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ ya.

  •   Anyị kweere na ememme Krismas adịghị Chineke mma n’ihi na o si n’ememme ndị ọgọ mmụọ malite.—2 Ndị Kọrịnt 6:17.

Ò nwere oké ihe dị n’ịgba Krismas?

 Ọtụtụ ndị ka na-agba Krismas n’agbanyeghị na ha ma na o si n’ememme ndị ọgọ mmụọ nakwa na Baịbụl akwadoghị ya. Ndị dị otú a nwere ike ịna-ajụ, sị: Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst ga-eji ghara ịgba ya ebe ọtụtụ Ndị Kraịst na-agba ya? Ò nwere oké ihe dị na ya?

 Baịbụl gwara anyị ka anyị na-eche echiche n’onwe anyị n’ihi na anyị nwere ‘ikike iche echiche.’ (Ndị Rom 12:1, 2) Baịbụl na-akụzikwara anyị ka anyị jiri eziokwu kpọrọ ihe. (Jọn 4:23, 24) Ọ bụ eziokwu na otú ndị ọzọ si were anyị dị anyị mkpa, ma anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ndị ọzọ kpọọ anyị asị.

 Ọ bụ eziokwu na anyị kpebiri na anyị agaghị na-agba Krismas, ma anyị na-ahapụ ndị mmadụ ka ha jiri ka ha kpebie ma hà ga-agba ma ọ̀ bụ na ha agaghị agba. Anyị anaghịkwa enye ndị na-agba ya nsogbu.