Ilu 11:1-31

  • Ndị dị umeala n’obi na-ama ihe (2)

  • Onye kwụsịrị ife Chineke na-ala ndị ọzọ n’iyi (9)

  • “Ihe na-aga nke ọma ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ” (14)

  • Ihe ga-agaziri onye na-emesapụ aka (25)

  • Ihe agaghị agaziri onye tụkwasịrị obi n’akụnụba ya (28)

11  Jehova kpọrọ ihe na-ezughị ezu e ji atụ̀ ihe asị,Ma ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe* na-adị ya mma.+   Ọ bụrụ na mmadụ adị mpako, a ga-emechu ya ihu.+ Ma onye dị umeala n’obi ma ihe.+   Ọ bụ ịkwụwa aka ọtọ na-edu ndị ezi omume,+Ma aghụghọ ndị ajọ omume na-aghọ ga-ala ha n’iyi.+   E nweghị uru akụnụba ga-aba n’ụbọchị oké iwe.*+ Ma, ọ bụ ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+   Ezi omume onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta na-eme ga-eme ka ihe gaziere ya,*Ma ihe agaghị agaziri onye ajọ omume* n’ihi ihe ọjọọ ọ na-eme.+   Ihe ga-anapụta ndị ezi omume bụ ezi omume ha na-eme,+Ma ihe na-agụ ndị aghụghọ agụụ ga-eme ka ha ma n’ọnyà.+   Ihe onye ajọ omume na-ele anya ya na-ala n’iyi ma ọ nwụọ. Ihe ọ na-atụ anya na ọ ga-eji ike ya mee anaghịzi enwe isi.+   A na-anapụta onye ezi omume ná nsogbu,Nsogbu ahụ abịaziere onye ajọ omume.+   Onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ* na-eji ọnụ ya ala onye agbata obi ya n’iyi,Ma ihe ndị ezi omume ma na-anapụta ha.+ 10  Àgwà ọma ndị ezi omume na-akpa na-eme ka ndị bi n’obodo na-enwe obi ụtọ,A na-etikwa mkpu ọṅụ ma e bibie ndị ajọ omume.+ 11  Ngọzi a na-agọzi ndị ezi omume na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’obodo,+Ma ihe ndị ajọ omume na-ekwu na-emebi obodo.+ 12  Onye na-enweghị uche na-akpọ onye agbata obi ya asị,Ma onye na-aghọta ihe nke ọma na-agbachi nkịtị.+ 13  Onye na-ekwutọ mmadụ na-agagharị na-akọsa ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara,+Ma onye a tụkwasịrị obi anaghị ekwu ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara. 14  Ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ezigbo ntụziaka,Ma ihe na-aga nke ọma* ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.+ 15  Onye ọ bụla nke kwere nkwa na ya ga-akwụ ego onye ọ na-amaghị bitere ma onye ahụ akwụghị ya,* ihe agaghị agaziri ya.+ Ma onye ọ bụla ọ na-anaghị adị ngwa ngwa ka ya na mmadụ kwekọrịta ihe ha ga-eme* anaghị aba ná nsogbu. 16  A na-akwanyere nwaanyị obiọma* ùgwù,+Ma ụmụ nwoke obi fere azụ na-ebukọrọ akụnụba. 17  Nwoke obiọma na-abara onwe ya uru,+Ma onye obi tara mmiri na-etinye onwe ya ná nsogbu.*+ 18  Ụgwọ ọrụ onye ajọ omume na-enweta anaghị aba uru ọ bụla,+Ma a na-akwụ onye ezi omume* ezigbo ụgwọ ọrụ.+ 19  Onye jisiri ike na-eme ezi omume ga-adị ndụ,+Ma onye obi ya dị n’ime ihe ọjọọ ga-anwụ. 20  Jehova kpọrọ ndị obi ha jọrọ njọ* asị,+Ma ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta na-eme ya obi ụtọ.+ 21  Ka obi sie gị ike na a ga-atarịrị onye ọjọọ ahụhụ,+Ma e nweghị ihe ga-eme ụmụ ndị ezi omume. 22  Nwaanyị mara mma nke na-achọghị inwe ezi ucheDị ka ọlaedo a gbanyere ézì n’imi. 23  Ihe na-agụ ndị ezi omume na-eme ka ha nweta ihe ọma,+Ma ihe ndị ajọ omume na-atụ anya ya na-eme ka e wesa ha nnukwu iwe. 24  E nwere onye na-eji obi ya niile enye ndị ọzọ ihe, ma ya ana-enwetakwu ihe.+ E nwekwara onye na-anaghị enye ndị ọzọ ihe o kwesịrị inye ha, ma ya adaa ogbenye.+ 25  Ihe ga-agaziri onye na-emesapụ aka,+Onye na-enyejukwa ndị ọzọ mmiri afọ ka a ga-enyeju mmiri afọ.+ 26  Onye na-ekweghị ewepụta ọka,* ndị mmadụ ga-abụ ya ọnụ,Ma ha ga-agọzi onye na-eresị ya ndị ọzọ. 27  A ga-emere onye na-agbasi mbọ ike ka o mee ihe dị mma amara,+Ma ihe ọjọọ ga-abịara onye na-agba mbọ ka o mee ihe ọjọọ.+ 28  Ọdachi ga-adakwasị onye tụkwasịrị obi n’akụnụba ya,+Ma ndị ezi omume ga-ama pokopoko ka akwụkwọ ndụ.+ 29  Onye ọ bụla nke na-ekotere ezinụlọ ya nsogbu* ga-agba aka,+Onye nzuzu ga-abụkwa ohu onye ma ihe. 30  Ihe onye ezi omume na-eme dị ka* osisi nke ndụ,+Onye na-eme ka ndị mmadụ mee ihe dị mma ma ihe.+ 31  Ọ bụrụ na onye ezi omume nke nọ n’ụwa na-enweta ụgwọ ọrụ,O doro anya na onye ajọ omume na onye mmehie ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nkume zuru ezu e ji atụ̀ ihe.”
Ma ọ bụ “oké iwe Chineke.”
Na Hibru, “ga-eme ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ.”
Na Hibru, “Ma onye ajọ omume ga-ada.”
Ma ọ bụ “Onye na-anaghị asọpụrụ Chineke.”
Ma ọ bụ “Ma a na-azọpụta ndị mmadụ.”
Ma ọ bụ “Onye ọ bụla nke nara onye ọ na-amaghị n’ibé.”
Na Hibru, “ka ya na mmadụ kwee n’aka.”
Ma ọ bụ “nwaanyị mara mma.”
Ma ọ bụ “na-emechu onwe ya ihu.”
Na Hibru, “onye na-akụ mkpụrụ ezi omume.”
Ma ọ bụ “ndị obi ha gbagọrọ agbagọ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “na-emenye ezinụlọ ya ihere.”
Na Hibru, “Mkpụrụ onye ezi omume na-amị bụ.”