Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Kwuru na Ụwa Dị Mbadamba?

Baịbụl Ò Kwuru na Ụwa Dị Mbadamba?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba, Baịbụl ekwughị na ụwa dị mbadamba. * Baịbụl abụghị akwụkwọ na-akọ banyere sayensị. Ma nke a apụtaghị na Baịbụl na-ekwu ihe dị iche n’ihe ndị sayensị na-ekwu. Ihe ndị e kwuru na Baịbụl “na-akwụsi ike ruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 111:8.

 Gịnị ka “nsọtụ anọ nke ụwa” e kwuru na Baịbụl pụtara?

 Mgbe a na-ekwu okwu ụwa na Baịbụl, e nwere ebe ndị e kwuru “nsọtụ anọ nke ụwa” na “n’ebe niile ụwa sọtụrụ.” Ma mmadụ ekwesịghị ịghọta ya n’ụzọ nkịtị, ka à ga-asị na ụwa nwere ngwụsị ma ọ bụ ebe ọ kwụsịrị. (Aịzaya 11:12; Job 37:⁠3) Kama nke ahụ, o doro anya na ihe e ji okwu ndị ahụ na-akọwa bụ ebe niile n’ụwa. Baịbụl kwudịrị okwu isi “n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ bịa, sikwa n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda.”​​—⁠Luk 13:⁠29.

 Okwu Hibru a sụgharịrị “nsọtụ” ma ọ bụ “sọtụrụ” yiri ka ọ bụ ilu e ji akọwa “nku nnụnụ.” Otu akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ International Standard Bible Encyclopedia, kwuru na “ebe ọ bụ na nku nnụnụ bụ ihe nnụnụ na-eji ekpuchi ụmụ ya, [okwu Hibru a] nwekwara ike ịpụta ngwụcha ngwụcha ihe ọ bụla a gbasapụrụ agbasapụ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na n’akwụkwọ Job 37:3 nakwa n’Aịzaya 11:​12, “okwu ahụ pụtara n’isi isi, n’ókè, ma ọ bụ ná ngwụcha ngwụcha ala.” *

 Oleekwanụ maka mgbe ahụ Ekwensu nwara Jizọs?

 Baịbụl kwuru banyere mgbe Ekwensu nwara Jizọs, sị: “Ekwensu kpọọrọ ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.” (Matiu 4:⁠8) Ụfọdụ na-ekwu na ihe a Baịbụl kwuru ebe a na-egosi na e nwere ike ịnọ n’otu ebe hụ ihe niile dị n’ụwa n’ihi na ụwa dị mbadamba. Ma ‘ugwu dị oké elu’ e kwuru okwu ya ebe a yiri ka ọ bụghị ebe nkịtị. Ka anyị legodị ihe mere na e kwesịghị ichewa ya otú ahụ.

  •   O nweghị ugwu nkịtị dị n’ụwa mmadụ ga-anọ na ya hụ alaeze niile nke ụwa.

  •   Ọ bụghị naanị alaeze niile nke ụwa ka Ekwensu gosiri Jizọs kamakwa “ebube ha.” E nweghịkwanụ otú mmadụ ga-esi anọ otu ebe dị anya hụ ihe niile ahụ. N’ihi ya, o yiri ka Ekwensu o ji ihe dị ka ọhụụ gosi Jizọs ihe ndị ahụ. Nke a nwere ike ịdị ka ebe mmadụ ji ihe e ji ele sinima na-egosi onye ọzọ foto ebe dị iche iche n’ụwa.

  •   Ebe a kọrọ gbasara ọnwụnwa Jizọs n’akwụkwọ Luk 4:5 kwuru na Ekwensu gosiri Jizọs “alaeze niile nke elu ụwa mmadụ bi n’otu ntabi anya,” ọ gaghị ekwe omume na mmadụ ga-eji anya nkịtị hụ ihe niile ahụ. Nke a na-egosi na Ekwensu si n’ụzọ ọzọ, na-abụghị iji anya nkịtị hụ ihe, gosi Jizọs ihe ndị ahụ.

^ Baịbụl kpọrọ Chineke “Onye bi n’ebe dị elu karịa ụwa nke dị gburugburu.” (Aịzaya 40:22) E nwere akwụkwọ ụfọdụ ndị kwuru na “gburugburu” e kwuru okwu ya ebe a nwere ike ịbụ ihe dị okirikiri, ma ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwetaghị nke a. Nke ọ bụla ọ bụ, Baịbụl akwadoghị na ụwa dị mbadamba.

^ Nke e dezigharịrị, Mpịakọta nke 2, peeji nke 4.