Ọrụ Ndịozi 14:1-28

  • E nwekwuru ndị na-eso ụzọ Jizọs n’Aịkoniọm, a kpagbukwara ha (1-7)

  • Ndị Listra chere na Pọl na Banabas bụ chi (8-18)

  • A tụrụ Pọl nkume, ma ọ nwụghị (19, 20)

  • Ha nọ na-agba ọgbakọ dị iche iche ume (21-23)

  • Ha gaghachiri Antiọk nke dị na Siria (24-28)

14  N’Aịkoniọm, Pọl na Banabas banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu ma kwuo okwu otú mere ka ọtụtụ ndị, ma ndị Juu ma ndị Grik, ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.  Ma ndị Juu na-anabataghị ihe ụmụnna ndị a kwuru mere ka ndị mba ọzọ megidewe ha.+  Ha wee nọtụkwuo izu ole na ole ebe ahụ, Jehova* enyekwa ha ike, ha ana-ekwu okwu ya n’atụghị egwu. O sikwa n’aka ha rụọ ọrụ ebube dị iche iche iji gosi na ozi ha na-ezi bụ ozi gbasara amara Chineke.+  Ma, ndị obodo ahụ kewara abụọ. Ụfọdụ nọ na-akwado ndị Juu, ndị ọzọ ana-akwado Pọl na Banabas.  Mgbe ndị mba ọzọ na ndị Juu nakwa ndị na-achị ha kpara nkata imenye ha ihere na ịtụ ha nkume,+  a gwara ha gbasara ya, ha agbaga n’obodo ndị dị na Likeonia, ya bụ, Listra na Dabe na obodo ndị dị ha gburugburu.+  Ha nọkwa na-ezisa ozi ọma n’ebe ndị ahụ.  Na Listra, e nwere otu nwoke nọ ọdụ. Ọ dara ngwọrọ, o jetụbeghịkwa ije kemgbe a mụrụ ya.  Nwoke a nọ na-ege ntị ka Pọl na-ekwu okwu. Mgbe Pọl legidere ya anya ma hụ na o kweere n’ihe ọ na-akụzi, kwerekwa na a ga-eme ka ahụ́ dị ya mma,+ 10  o kwuru n’olu dara ụda, sị: “Guzoro ọtọ.” O wee malie, malite ije ije.+ 11  Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu n’asụsụ ndị Likeonia, sị: “Ndị bụ́ chi dịzi ka ụmụ mmadụ bịakwute anyị!”+ 12  Ha wee malite ịkpọ Banabas Zus,* ma na-akpọ Pọl Hemis,* maka na ọ bụ ya ka ekwu okwu. 13  Onye nchụàjà n’ụlọ arụsị Zus, nke dị n’ọnụ ụzọ ámá obodo Listra, wetara okooko osisi, kpụtakwa oké ehi ndị ya na ìgwè mmadụ ahụ chọrọ iji chụọrọ Pọl na Banabas àjà. 14  Ma, mgbe Banabas onyeozi na Pọl onyeozi nụrụ gbasara ya, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ gakwuru ìgwè mmadụ ahụ, tie mkpu, sị ha: 15  “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị bụ mmadụ nkịtị otú unu bụ.+ Anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu kwụsị ife ihe efu ndị a ma bịa fewe Chineke dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha.+ 16  N’oge ochie, ọ hapụrụ ndị mba ọzọ niile ka ha na-eme otú masịrị ha.+ 17  Ma, ihe ọma ndị ọ na-eme na-egosi unu ụdị onye ọ bụ.+ Ọ na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju,+ na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.”+ 18  Ma n’agbanyeghị ihe ndị a ha kwuru, o siiri ha ike tupu ha egbochie ìgwè mmadụ ahụ ịchụrụ ha àjà. 19  Ma, e nwere ndị Juu si Antiọk na Aịkoniọm bịa mee ka ìgwè mmadụ ahụ megidewe Pọl,+ tụọ ya nkume, kpụrụkwa ya gaa kpụsa n’azụ obodo, na-eche na ọ nwụọla.+ 20  Ma, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gbara ya gburugburu, o biliri ma banye n’obodo. N’echi ya, ya na Banabas gawara Dabe.+ 21  Mgbe ha zichara ozi ọma n’obodo ahụ, meekwa ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha laghachiri Listra, Aịkoniọm, na Antiọk. 22  Ha nọ na-agba ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ebe ndị ahụ ume+ ka ha sie ike n’okwukwe. Ha sịkwara ha: “Ọtụtụ nsogbu ga-abịara anyị tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke.”+ 23  Ha họpụtakwara ndị okenye n’ọgbakọ nke ọ bụla.+ Ha kpere ekpere, buo ọnụ,+ ma nyefee ndị okenye ahụ n’aka Jehova* maka na ha kweere na ya. 24  Ha* wee si Pisidia bata Pamfilia.+ 25  Mgbe ha kwusachara okwu Chineke na Paga, ha gawara Atalaya. 26  Ha sikwa ebe ahụ banye ụgbọ mmiri bugara ha Antiọk. N’oge mbụ ha gara Antiọk, ụmụnna nọ ebe ahụ rịọrọ Chineke ka o meere ha* amara ka ha rụchaa ọrụ a ha rụcharala ugbu a.+ 27  Mgbe ha ruru Antiọk, kpọkọta ọgbakọ ahụ, ha kọọrọ ha ọtụtụ ihe Chineke si n’aka ha mee, kọọkwa na o megheerela ndị mba ọzọ ụzọ ha ga-esi kwere na ya.+ 28  Ha na ndị na-eso ụzọ Jizọs bi ebe ahụ nọkwara ruo oge ụfọdụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ma ọ bụ “Jupita.”
Ma ọ bụ “Mekuri.”
Gụọ A5.
Ya bụ, Pọl na Banabas.
Ya bụ, Pọl na Banabas.