Jeremaya 17:1-27

  • E ji mkpịsị akwụkwọ ígwè dee mmehie Juda (1-4)

  • A ga-agọzi onye tụkwasịrị Jehova obi (5-8)

  • Obi dị aghụghọ (9-11)

  • Jehova bụ onye ndị Izrel ji nwee olileanya (12, 13)

  • Ekpere Jeremaya kpere (14-18)

  • E kwesịrị ido Ụbọchị Izu Ike nsọ (19-27)

17  “E ji mkpịsị akwụkwọ ígwè dee mmehie Juda. E ji mkpịsị akwụkwọ dayamọnd kanye ya ná mbadamba nkume, ya bụ, n’obi ha. E jikwa ya kanye ya na mpi ndị dị n’ebe ndị ha na-achụ àjà.   Ụmụ ha na-echetakwa ebe ndị a ha na-achụ àjà na ogwe osisi arụsị*+ haNdị dị n’akụkụ nnukwu osisi na-ama pokopoko, n’elu ugwu ndị dị elu+   Nakwa n’ugwu ndị dị n’ọhịa. M ga-eji maka mmehie unu na-eme n’ala unu niile mee ka e bukọrọ akụ̀ unu niile na ihe ndị ọzọ unu nwe+Nakwa ihe unu ndị dị n’ebe ndị dị elu.+   Unu ji aka unu hapụ ihe m kenyere unu.+ M ga-emekwa ka unu jewere ndị iro unu ozi n’ala unu na-amaghị,+N’ihi na unu emeela ka iwe m dị ọkụ.*+ Ọ ga na-erekwa mgbe niile.”   Jehova kwuru, sị: “Onye tụkwasịrị mmadụ nkịtị obi,+Onye ji ike mmadụ nwee nchekwube,+Onye obi ya na-adịghịzi n’ebe Jehova nọ, a ga-abụ ya ọnụ.   Ọ ga-adị ka osisi naanị ya dị n’ọzara. Ihe ọma agaghị eru ya aka. Kama, ọ ga-ebi n’ebe kpọrọ nkụ n’ala ịkpa,N’ala bụ́ nnu nnu nke ọ na-enweghị onye ga-ebili na ya.   A ga-agọzi onye tụkwasịrị Jehova obi,Onye ji maka Jehova nwee obi ike.+   Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri,Nke gbanyere mgbọrọgwụ na mmiri. Ọ gaghị ama mgbe ụbọchị na-ekpo ọkụ,Kama akwụkwọ ya ga na-ama pokopoko.+ Ọ gaghị na-echegbu onwe ya n’afọ mmiri na-ezoghị. Ọ gaghịkwa akwụsị ịmị mkpụrụ.   Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ. O sikwara ike njite.*+ Ònye ga-amatali ya? 10  Mụnwa, bụ́ Jehova, na-enyocha obi,+Na-enyochakwa ihe mmadụ na-eche n’ime ime obi ya,*Iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà,Kwụọkwa ya ụgwọ ihe ọ rụpụtara.+ 11  Onye ji aghụghọ na-akpa akụ̀+Dị ka ọkwà nke kpokọtara àkwá ọ na-eyighị. Onye ahụ ga-anwụchu ọnwụ, hapụ akụ̀ ya. N’ikpeazụ, ọ ga-abụ onye na-amaghị ihe.” 12  Ụlọ nsọ anyị bụ ocheeze dị ebube+Nke dị elu site ná mmalite. 13  Jehova, onye ndị Izrel ji nwee olileanya,Ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị. N’ájá ka a ga-ede aha ndị kwụsịrị ife gị* ofufe,+N’ihi na ha ahapụla Jehova, bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.+ 14  Jehova, biko, gwọọ m ka m gbakee. Zọpụtakwa m ka ihe ọ bụla ghara ime m,+N’ihi na ọ bụ gị ka m na-eto. 15  E nwere ndị na-asị m: “Gịnị mere na okwu Jehova emezubeghị?+ Biko, ya mezuo.” 16  Ma, akwụsịghị m ịbụ onye ọzụzụ atụrụ. Akwụsịghịkwa m ịna-eso gị. Anọghịkwa m na-atụ anya ka e nwee ụbọchị ọdachi ga-abịa. Ị ma ihe egbugbere ọnụ m kwuru. Ọ bụ n’ihu gị ka m kwuru ya. 17  Emenyekwala m ụjọ. Ị bụ ebe m ga-agbaba n’ụbọchị ọdachi. 18  Ka ihere mee ndị na-akpagbu m,+Ma ekwela ka ihere mee m. Ka ụjọ jide ha,Ma ekwela ka ụjọ jide m. Mee ka e nwee ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.+ Bibie ha, bibie ha kpamkpam.* 19  Jehova gwara m, sị: “Gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá ụmụ ndị m, ebe ndị eze Juda na-esi abata ma na-apụ. Guzorokwa n’ọnụ ụzọ ámá niile dị na Jeruselem.+ 20  Sịkwa ha, ‘Ndị eze Juda, ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jeruselem, ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị a abata, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 21  Jehova kwuru, sị: “Lezienụ onwe unu* anya, unu ebula ihe ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike. Unu esikwala n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem bubata ihe.+ 22  Unu esikwala n’ụlọ unu bupụta ibu ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike. Unu arụkwala ọrụ ọ bụla n’ụbọchị ahụ.+ Doonụ Ụbọchị Izu Ike nsọ otú m gwara nna nna unu hà ka ha na-eme.+ 23  Ma ha egeghị ntị. Ha atọghịkwa ntị n’ala. Ha kpọrọ ekwo nkụ* jụ irube isi, jụkwa ịnabata aka ná ntị a na-adọ ha.”’+ 24  “‘Jehova kwuru, sị, “Ma, ọ bụrụ na unu erubere m isi n’ihe niile, ghara isi n’ọnụ ụzọ ámá obodo a bubata ibu n’Ụbọchị Izu Ike, gharakwa ịrụ ọrụ ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike, si otú ahụ na-edo ya nsọ,+ 25  ọ ga-eme ka ndị eze na ndị isi, bụ́ ndị nọ n’ocheeze Devid,+ si n’ọnụ ụzọ ámá obodo a na-abata. Ha na ndị ha ji mere ndị isi nakwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem ga-agbara ụgbọ ịnyịnya ha na ịnyịnya ha bịa.+ Ndị mmadụ ga na-ebikwa n’obodo a mgbe niile. 26  Ndị mmadụ ga-esi n’obodo ndị dị na Juda, sikwa na gburugburu Jeruselem nakwa n’ala Benjamin+ nakwa n’ala dị larịị+ nakwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu nakwa na Negeb* na-eweta àjà a na-esucha ọkụ,+ àjà ọka,+ frankinsens, àjà ekele, na àjà ndị ọzọ+ n’ụlọ Jehova.+ 27  “‘“Ma ọ bụrụ na unu enupụrụ m isi ghara ido Ụbọchị Izu Ike nsọ, na-ebu ibu, buru ya na-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem n’Ụbọchị Izu Ike, m ga-esunye ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ. Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ndị a rụsiri ike dị na Jeruselem.+ A gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “N’ihi na iwe m amụnyela unu ọkụ.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ naghịkwa ekwe ngwọta.”
Na Hibru, “Na-enyochakwa akụrụ.”
Na Hibru, “ife m,” ọ ga-abụrịrị Jehova ka ha kwụsịrị ife.
Ma ọ bụ “bibie ha okpukpu abụọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Hibru, “Ha kwesiri olu ike.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”