Ozi Ọma Luk Dere 12:1-59

  • Ihe iko achịcha ndị Farisii (1-3)

  • Na-atụ Chineke egwu, atụla egwu mmadụ (4-7)

  • Onye na-agwa ndị mmadụ na ya ma Kraịst (8-12)

  • Ihe atụ gbasara otu nwoke nzuzu bara ọgaranya (13-21)

  • Kwụsịnụ ichegbu onwe unu (22-34)

    • Ìgwè atụrụ nta (32)

  • Ịmụrụ anya (35-40)

  • Ohu kwesịrị ntụkwasị obi na ohu na-ekwesịghị ntụkwasị obi (41-48)

  • Iweta nkewa, ọ bụghị udo (49-53)

  • Ịghọta ihe na-eme n’oge a (54-56)

  • Idozi okwu (57-59)

12  N’oge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara nke na ha nọ na-azọ ibe ha ụkwụ, ọ malitere ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lezienụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii, ya bụ, otú ha si dịrị ihu abụọ.+  Ma e nweghị ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. E nweghịkwa ihe nzuzo a na-agaghị amata.+  N’ihi ya, ihe ọ bụla unu kwuru n’ọchịchịrị, a ga-anụ ya n’ìhè. A ga-anọkwa n’elu ụlọ kwusaa ihe unu nọ n’ime ụlọ unu takwunyere mmadụ.  Ana m asịkwa unu, ndị enyi m,+ unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ́, ha gbuchaa ya, ha enweghị ike ime ihe ọ bụla ọzọ.+  Ma, aga m agwa unu onye unu ga-atụ egwu: Onye unu ga-atụ egwu bụ onye nwere ikike ịtụba mmadụ na Gehena*+ ma o gbuchaa ya. N’eziokwu, ana m asị unu, tụọnụ ya egwu.+  Ọ̀ bụ na a naghị ere nza ise mkpụrụ ego abụọ* nke ga-azụta ntakịrị ihe? Ma, o nweghị otu n’ime ha Chineke na-echefu.*+  Ọ madị ole ntutu niile dị n’isi unu dị.+ Unu atụla egwu. Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.+  “Ana m asị unu, onye ọ bụla nke na-agwa ndị mmadụ na ya ma m,+ Nwa nke mmadụ ga-agwakwa ndị mmụọ ozi Chineke na ọ ma onye ahụ.+  Ma, onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, m ga-agọnahụ ya n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke.+ 10  Onye ọ bụla nke kwuluru Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya. Ma a gaghị agbaghara onye ọ bụla kwuluru mmụọ nsọ.+ 11  Ma mgbe ha kpọọrọ unu gaa n’ebe ọha mmadụ na-ezukọ,* ma ọ bụ n’ihu ndị ọchịchị ma ọ bụ n’ihu ndị isi, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi zara ọnụ unu ma ọ bụ ihe unu ga-asa ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu,+ 12  n’ihi na mmụọ nsọ ga-agwa unu n’oge ahụ ihe unu kwesịrị ikwu.”+ 13  Otu onye n’ime ìgwè mmadụ ahụ wee sị ya: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee akụ̀ nna anyị.” 14  Ọ sịrị ya: “Nwoke m, ònye mere m onyeikpe ma ọ bụ onye na-ekere unu ihe?” 15  Ọ gwaziri ha, sị: “Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla,+ n’ihi na mmadụ nwegodị ọtụtụ ihe, ihe o nwere anaghị eme ka ọ dị ndụ.”+ 16  O meere ha otu ihe atụ, sị: “Ala nke otu onye bara ọgaranya mepụtara ihe nke ọma. 17  N’ihi ya, ọ malitere ịgwa onwe ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na enweghị m ebe m ga-akwasa ihe m wetara n’ubi m?’ 18  N’ihi ya, ọ sịrị: ‘Ihe m ga-eme bụ:+ M ga-akwada ụlọ m na-akwasa ihe ma rụọ nke ka ibu. N’ebe ahụ ka m ga-akwasa mkpụrụ m niile na ihe m niile. 19  M ga-agwakwa onwe m,* sị: “I* nwere ọtụtụ ezigbo ihe ị kpakọtara ga-ezuru gị ruo ọtụtụ afọ. Tụsara ahụ́, na-eri, na-aṅụ, na-enwekwa aṅụrị.”’ 20  Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ ndụ* gị n’aka gị. Ònye ka ihe ndị ị kwakọtara ga-abụ nke ya?’+ 21  Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọtara onwe ya akụ̀ ma ọ bụghị ọgaranya n’anya Chineke.”+ 22  Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya: “Ọ bụ ya mere m ji asị unu, kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere ndụ* unu maka ihe unu ga-eri, ma ọ bụ maka ihe unu ga-eyi n’ahụ́.+ 23  N’ihi na ndụ* dị mkpa karịa nri, ahụ́ dịkwa mkpa karịa ákwà. 24  Leruonụ ugoloọma anya: Ha anaghị akụ mkpụrụ, ha anaghịkwa ewe ihe ubi. Ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ ha na-akwasa ihe. Ma Chineke na-enye ha nri.+ Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa nnụnụ?”+ 25  Ònye n’ime unu ga-agbakwụnyeli otu kubit* n’afọ ndụ ya maka na ọ na-echegbu onwe ya? 26  N’ihi ya, ọ bụrụ na unu agaghị emeli obere ihe a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ?+ 27  Leruonụ otú okooko lili si eto anya: Ha anaghị arụgbu onwe ha n’ọrụ, ha anaghịkwa akpa ogho. Ma ana m asị unu, na Solomọn eyighị uwe mara mma ka otu n’ime ha n’agbanyeghị ebube ya niile.+ 28  Ọ bụrụkwa na Chineke si otú a yiwe ahịhịa ndụ dị n’ọhịa uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karịa, unu ndị okwukwe nta? 29  N’ihi ya, kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Kwụsịkwanụ iche oké echiche,+ 30  n’ihi na ihe ndị a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. Ma, Nna unu ma na ihe ndị a dị unu mkpa.+ 31  Kama, na-achọnụ Alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.+ 32  “Ìgwè atụrụ nta, unu atụla egwu,+ n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu Alaeze.+ 33  Reenụ ihe unu nwere ma were ihe unu retara nye onyinye ebere.*+ Nwetanụ obere akpa ego ndị na-anaghị aka aka, ya bụ, akụ̀ na-anaghị agwụ agwụ n’eluigwe,+ ebe onye ohi na-anaghị eru nso, ebe egu* na-agaghịkwa eri ya. 34  N’ihi na n’ebe akụ̀ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa. 35  “Yirinụ uwe unu, jikerekwanụ,*+ ka mpanaka* unu na-enwukwa enwu.+ 36  Dịrịkwanụ ka ndị na-eche ka nna ha ukwu si ebe ọ gara ịlụ nwaanyị lọta,+ ka ọ ga-abụ, ọ lọta kụọ aka n’ụzọ, ha emegheere ya ụzọ ozugbo. 37  Ndị ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma nna ha ukwu lọta wee hụ na ha na-eche nche. N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eyiri ákwà ọ ga-eji jee ozi, nọdụkwa ala ka o rie ihe na tebụl. Ọ ga-abịakwa jeere ha ozi. 38  Ọ bụrụkwa na ọ lọta n’oge nche nke abụọ,* ma ọ bụdị na nke atọ,* ma hụ na ha na-eche nche, ha ga-enwe obi ụtọ. 39  Ma maranụ na a sị na onyeisi ezinụlọ ma oge onye ohi ga-abịa, ọ garaghị ekwe ka ọ bata n’ụlọ ya.+ 40  Dịrịkwanụ njikere, n’ihi na Nwa nke mmadụ na-abịa n’oge unu na-echeghị na ọ ga-abụ.”+ 41  Pita wee sị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị ka ị na-emere ihe atụ a, ka ọ̀ bụ mmadụ niile?” 42  Onyenwe anyị wee sị: “Ònye n’eziokwu bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwere uche,* onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ndị na-ejere ya ozi, ka ọ na-enye ha ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị?+ 43  Ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ. 44  N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere. 45  Ma, ọ bụrụ na ohu ahụ ekwuo n’obi ya, sị: ‘Nna m ukwu na-egbu oge ịbịa,’ wee malite iti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi ihe, na-eri, na-aṅụ, mmanya ana-egbukwa ya,+ 46  nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya nakwa n’oge ọ na-amaghị. Ọ ga-atakwa ya ezigbo ahụhụ ma kpọga ya n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ. 47  Ma ohu nke ma ihe nna ya ukwu chọrọ, ma ọ dịghị njikere, o meghịkwa ihe nna ya ukwu chọrọ, a ga-apịa ya ọtụtụ ọnụ ụtarị.+ 48  Ma onye na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ, wee mee ihe kwesịrị ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ọnụ ụtarị ole na ole. N’eziokwu, onye ọ bụla e nyere ihe ukwu, a ga-achọ ihe ukwu n’aka ya. Onye e nyere ihe ukwu ka ọ na-elekọta, a ga-achọkwa ihe ukwu n’aka ya.+ 49  “Abịara m ịmụnye ọkụ n’ụwa. Ebe ọ bụ na a mụnyela ya, gịnịzi ka m na-achọ? 50  N’eziokwu, e nwere baptizim m na-aga ime. Obi agaghịkwa adị m mma ruo mgbe m mere ya.+ 51  Ùnu chere na m bịara ime ka udo dịrị n’ụwa? Ana m asị unu, mba, kama ọ bụ ikewa ndị mmadụ.+ 52  N’ihi na si ugbu a gawa, mmadụ ise bi n’otu ụlọ ga-ekewa, mmadụ atọ ga na-emegide mmadụ abụọ, mmadụ abụọ ana-emegide mmadụ atọ. 53  Ha ga-ekewa, nna ga na-emegide nwa ya nwoke, nwa nwoke ana-emegide nna ya, nne ana-emegide nwa ya nwaanyị, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya. Nne di ga na-emegide nwunye nwa ya, nwunye nwa ana-emegide nne di ya.”+ 54  Ọ gwakwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihu ígwé na-agbachi n’ebe ọdịda anyanwụ, unu na-ekwu ozugbo ahụ, sị, ‘Ezigbo mmiri ga-ezo.’ Ọ na-emekwa otú ahụ. 55  Mgbe unu hụrụ na ifufe si n’ebe ndịda na-efe, unu na-asị, ‘Oké okpomọkụ ga-adị,’ ọ na-adịkwa. 56  Ndị ihu abụọ, unu ma otú e si amata otú ihu ígwé ga-adị, gịnịzi mere na unu anaghị aghọta ihe na-eme n’oge a?+ 57  Gịnị mere na unu anaghị amata ihe unu kwesịrị ime? 58  Dị ka ihe atụ, mgbe gị na onye gbara gị akwụkwọ na-agakwuru onye na-achị achị, gbalịa ka unu dozie okwu ahụ ọsọ ọsọ mgbe unu ka nọ n’ụzọ, ka ọ ghara ịkpụga gị n’ihu ọkàikpe, ọkàikpe enyefeekwa gị n’aka onye nche ụlọikpe, onye nche ụlọikpe atụbakwa gị n’ụlọ mkpọrọ.+ 59  N’eziokwu, ana m asị gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụrụ obere mkpụrụ ego ikpeazụ i nwere.”*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “mkpụrụ ego asariọn abụọ.” Gụọ B14.
Ma ọ bụ “na-eleghara anya.”
O nwere ike ịbụ, “n’ụlọ nzukọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi, i.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Gụọ B14.
Ma ọ bụ “nye ndị ogbenye onyinye.” Gụọ Nkọwa Okwu.
N’ala Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
Ma ọ bụ “oriọna.”
Na Grik, “Keenụ ájị̀ n’úkwù.”
Malite n’ihe dị ka elekere itoolu nke abalị ruo etiti abalị.
Malite n’etiti abalị ruo n’ihe dị ka elekere atọ n’ime abalị.
Ma ọ bụ “nke ma ihe.”
Na Grik, “mkpụrụ ego leptọn ikpeazụ i nwere.” Gụọ B14.