Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Ọ̀ Ga-aghọ Paradaịs?

Ụwa Ọ̀ Ga-aghọ Paradaịs?

Echiche Baịbụl

Ụwa Ọ̀ Ga-aghọ Paradaịs?

N’ỌTỤTỤ mba—ndị ụfọdụ n’ime ha bụ Ijipt, Mexico, Peru, na Tibet—e nwere akụkọ ọdịnala ndị na-ekwu na e nwere oge udo dị n’ụwa, bụ́ oge ụmụ mmadụ na-anaghị eme ihe ọjọọ, oge ha na Chineke dị n’ezigbo mma, oge ha na-adịghị arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Akụkọ ndị a na-ekwukwa banyere oge mmadụ malitere ime mmehie.

Ọ bụ eziokwu na a gwagbuola akụkọ ndị a, tinyekwa ha nnu na ose, e nwere nnọọ ọtụtụ ụzọ ha si yie ibe ha, nke na e kwesịghị iwere ha dị ka ihe mere ná ndaba. Nke a emeela ka ọtụtụ mmadụ kwuo na e si n’ihe ndị mere eme nweta akụkọ ndị ahụ. N’eziokwu, ihe na-agbata mmadụ n’uche ma a kọwa akụkọ ndị ahụ yitewere nnọọ ihe dị n’isiakwụkwọ ndị mbụ nke akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis. Ma, ihe a kọrọ na Jenesis abụghị ụdị akụkọ mgbe ochie ndị na-edoghị anya, kama ọ bụ ihe ndị mere eme a kọrọ n’ụzọ doro anya.—2 Timoti 3:16.

Mmalite Zuru Okè

Akwụkwọ Jenesis na-agwa anyị na mgbe Chineke kere mmadụ abụọ mbụ—bụ́ Adam na Iv—o mere ka ha biri n’ubi nke mmiri gbara gburugburu, nke a na-akpọ Ubi Iden. Ha nwere ezigbo ahụ́ ike na olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. Ọnwụ bụ ntaramahụhụ ha ga-enweta ma ha mehie. (Jenesis 2:8-17; Ndị Rom 5:12) Adam na Iv gaara ‘amụ ọmụmụ, baa ụba ma jupụta ụwa, meekwa ka ihe niile dịrị n’okpuru ha.’ (Jenesis 1:28) Nke a gaara eme ka e nwee paradaịs zuru ụwa ọnụ nke ụmụ mmadụ zuru okè jupụtara na ya, ma jiri obi ụtọ na-edo onwe ha n’okpuru Chineke, bụ́ Onye Ọchịchị ha.

Ọ dị mwute na Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, si otú a tụfuo ma ohere ha nwere imezu nzube Onye kere ha ma olileanya ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi. Otú o sina dị, Jehova Chineke ga-emezu nzube ya maka ụwa. O kwuru, sị: “Okwu m nke si n’ọnụ m pụta . . . [agaghị] agba aka lọghachikwute m,” kama ‘ọ ga-emezu ihe m zigara ya ka o mee.’ (Aịzaya 55:11) N’eziokwu, nzube Jehova maka ụwa a ịghọ paradaịs nke ụmụ mmadụ na-eme ihe Chineke na-achọ ga-ebi na ya bụ isiokwu bụ́ isi nke Baịbụl.—Ndị Rom 8:19-21.

“Mụ na Gị Ga-anọ na Paradaịs”

Ozugbo Adam na Iv mehiere, Chineke kwere nkwa otu “mkpụrụ,” ma ọ bụ nwa, bụ́ onye ga-ebibi “agwọ mbụ ahụ,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu kpamkpam, ma bibie ọrụ ọjọọ ya niile. (Jenesis 3:15; Mkpughe 12:9; 1 Jọn 3:8) E mechara ghọta na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ akụkụ bụ́ isi nke “mkpụrụ” ahụ. (Ndị Galeshia 3:16) Ọzọkwa, Chineke họpụtara ya ịbụ Eze nke Alaeze ma ọ bụ ọchịchị eluigwe, nke ga-achị ụwa niile.—Daniel 7:13, 14; Mkpughe 11:15.

Kraịst ga-emezu ihe ndị Adam na-emeghị. N’eziokwu, Baịbụl kpọrọ Jizọs “Adam ikpeazụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:45) Ọzọkwa, n’ekpere nlereanya Jizọs, o gosiri na e nwere ihe jikọrọ Alaeze Chineke na ihe ga-eme n’ụwa n’ọdịnihu, ma kwuo, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:10.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa—ebe ọ bụ Eze ga-achị ụwa n’ọdịnihu—o ruru eru ịgwa nwoke ahụ na-eme ihe ọjọọ a kpọgbukọtara ya na ya, bụ́ onye chegharịrị echegharị, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Paradaịs ahụ Jizọs bu n’obi ga-abụ n’ụwa, dị nnọọ ka Chineke si chọọ ya. Baịbụl kwadosiri eziokwu a ike. Tụlee amaokwu Baịbụl ndị a na-esonụ.

“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.” (Abụ Ọma 72:16) “Ọ bụ ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya.” (Ilu 2:21) “Ha [ya bụ, ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta] agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum; n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”—Aịzaya 11:9.

N’ikwekọ n’ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru, n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs a maara nke ọma, ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Jọn onyeozi mechara dee, sị: “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) O doro anya na amaokwu Baịbụl ndị a anaghị ekwu banyere “paradaịs” dị n’eluigwe, kama ha na-ekwu banyere nke a na-ahụ anya ga-adị n’ụwa ebe a.

Ihe Ndị Ọkà Mmụta Baịbụl Kwurula

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na n’Alaeze Kraịst, ụwa ga-aghọ paradaịs. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Joseph A. Seiss kwuru, sị: “Mgbe Mesaya ga-amalite ịchị ụwa dum, ụwa ga-emecharịrị ghọọ . . . ihe ahụ ọ . . . gaara abụ ma a sị na Adam emehieghị.” N’akwụkwọ bụ́ The New Testament for English Readers, Henry Alford dere, sị: “Alaeze Chineke ahụ . . . ga-anọgide na-arụ ọrụ ruo mgbe ọ ga-emecha ghọọ alaeze na-achị ụwa, ndị ọ ga-achị emechaakwa keta ụwa . . . , n’oge a ga-eme ka ọ dịghachi ọhụrụ nakwa oge a ga-agọzi ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọ bụ ya dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.

N’otu aka ahụkwa, Isaac Newton, onye bụ́ ọkà mmụta sayensị a ma ama, nakwa onye na-amụsi Baịbụl ike, dere, sị: “Ụmụ mmadụ ga-anọgide na-ebi n’ụwa ma ụbọchị ikpe gasịa, ọ bụghịkwa ruo naanị otu puku afọ, kama ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.”

Ebe ọ bụ na ọ bụ Jizọs Kraịst n’onwe ya ga-achị ụwa, mmebi iwu agaghị ewelitekwa isi ọzọ. (Aịzaya 11:1-5, 9) Ee, akụkụ niile nke ụwa ga-aghọ paradaịs, na-ewetara Onye kere ya otuto ruo mgbe ebighị ebi.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Gịnị bụ nzube mbụ Chineke maka ụmụ mmadụ na maka ụwa?—Jenesis 1:28.

▪ Olee ihe Alaeze Chineke ga-eme?—Matiu 6:10.

▪ Gịnị mere na mmebi iwu agaghị ewelite isi ọzọ?—Aịzaya 11:1-5, 9.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 11]

“Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5