Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Ihe Ga-enyere Di na Nwunye Aka Ịna-agbaghara Ibe Ha

Ihe Ga-enyere Di na Nwunye Aka Ịna-agbaghara Ibe Ha

IHE MERE NA Ọ NAGHỊ ADỊ MFE

Ọ̀ na–abụ gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị sewe okwu, gị echetara ya ihe o mere gị n’oge gara aga? Gịnị ka i chere mere i ji ekwulite ihe ndị ahụ? O nwere ike ịbụ na gịnwa ma ọ bụkwanụ unu abụọ anaghị agbaghara ibe unu.

Ma, i nwere ike malite ịgbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị. Ka anyị tụlegodị ihe ndị nwere ike ime ka o siere di na nwunye ike ịgbaghara ibe ha.

IHE MERE NA DI NA NWUNYE ỤFỌDỤ ANAGHỊ AGBAGHARA IBE HA

Ha na-eji ya emesi ibe ha ike. Ihe mere ụfọdụ anaghị agbaghara di ha ma ọ bụ nwunye ha bụ ka ha nwee ihe ha ga-eji na-emesi ha ike. Kama ịgbaghara, ha na-agụkọ ihe e mere ha. O nwezie ka ha si see okwu, ha ekwulite ihe ahụ ka ha jiri ya kpegbuo di ha ma ọ bụ nwunye ha.

Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye buuru ibe ya iwe n’obi. Mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike tupu mmadụ echefuo ihe e mere ya. Mmadụ nwere ike ịsị na ya agbagharala di ya ma ọ bụ nwunye ya ma ihe ahụ o mere ya ka na-ewe ya iwe. O nwedịrị ike ịbụ na ọ na-achọ otú ọ ga-esi emegwara ya.

Ọ bụrụ na ihe agaghị otú e chere. Ụfọdụ di na nwunye na-atụ anya na ihe niile ga na-aga siriri werere otú ahụ a na-eme na fim. Ma ha see okwu, ya adị ha ka ọ bụ ná nrọ. Ha ga na-eche ihe mere ha na onye ha hụrụ n’anya ji na-ese okwu. Ebe ọ bụ na ihe ha tụrụ anya ya abụghị ihe ha na-ahụ, ha ga na-achọpụtakarị ebe ibe ha na-emejọ, ọ ga-emekwa ka ha ghara ịna-agbaghara ibe ha.

Ọ bụrụ na ha aghọtaghị ihe mgbaghara bụ. Ọtụtụ di na nwunye anaghị agbaghara ibe ha n’ihi na ha aghọtachaghị ihe ịgbaghara mmadụ pụtara. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-eche, sị:

M gbaghara ya, ọ ga-adịzi ka o nweghị ihe o mere.

M gbaghara ya, ọ pụtara na m ga-echefu ihe ahụ o mere.

M gbaghara ya, ọ ga-eme ka o mee ihe ahụ ọzọ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na onye gbaghaara mmadụ n’eziokwu agaghị na-eche ihe ndị ahụ. Ma, ịgbaghara mmadụ adịghị mfe, karịchaa ma ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ na nwunye gị mere gị ihe na-ewute gị.

IHE Ị GA-EME

Ghọta ihe ịgbaghara mmadụ pụtara. Na Baịbụl, okwu e si sụgharịta mgbaghara nwere ike ịpụta mmadụ ịhapụ ihe e mere ya. N’ihi ya, ọ pụtaghị na ị ga-echefu ihe mmadụ mere gị n’agbanyeghị na ị gbagharala ya. Ọ pụtaghịkwa na ihe ahụ o mere gị enweghị ihe ọ bụ. Mgbe ụfọdụ, ihe i nwere ike ime bụ ileghara ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị mere gị anya. Ime otú a agaghị na-emebi gị obi. Ọ ga-emekwa ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ebi n’udo.

Ghọta ihe nwere ike ime ma ị jụ ịgbaghara ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na mmadụ iburu ndị ọzọ iwe n’obi nwere ike ịkpatara onye ahụ ọtụtụ nsogbu. O nwere ike ime ka isi ghara ịna-akpakọ onye ahụ ọnụ ma ọ bụ mee ka ọ rịawa ọbara mgbali elu. Ọ na-emekwa ka di na nwunye na-esekarị okwu. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.”—Ndị Efesọs 4:32.

Ghọta na ịgbaghara ya ga-abara gị uru. Ọ bụrụ na di na nwunye na-agbaghara ibe ha, ọ ga-eme ka ha na-atụkwasị ibe ha obi, meekwa ka ha kweta na onye nke mejọrọ ebughi ihe ọjọọ n’obi. Ọ ga-emekwa ka ha ghara ịna-agụkọrọ ibe ha ihe ọjọọ ha mere. Ime otú ahụ ga-eme ka ha ghara ịna-esekarị okwu, ha ga na-ahụkwu ibe ha n’anya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:13.

Na-ele ihe anya otú ọ dị. Ọ bụrụ na i cheta na di gị ma ọ bụ nwunye gị ezughị okè, ọ ga-adịrị gị mfe ịgbaghara ya. Otu akwụkwọ kwuru na ọ bụrụ na ihe mmadụ na-eche bụ ihe di ya ma ọ bụ nwunye ya na-adịghị emeta, ọ ga-eme ka o chefuo ihe ọma niile ọ na-emere ya. Ọ́ gaghị aka mma ka ilekwasị anya n’ihe ndị ọ na-emeta? Cheta na e nweghị mmadụ zuru okè, ma gịnwa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 3:2.

Nwee ezi uche. Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị emee ihe were gị iwe n’oge ọzọ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a ọ̀ bụ ihe anyị ga-esewere okwu? Ọ̀ bụ ihe m ga-eji chọọ ka ọ rịọ m mgbaghara, ka ọ bụ ihe m kwesịrị ileghara anya?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 4:8.

Gị na ya nwere ike ikwu banyere ya. Wetuo obi gwa ya ihe were gị iwe na ihe mere ihe ahụ ji wee gị iwe. Atala ya ụta ma ọ bụ katọwa ihe o kwuru n’ihi na o nwere ike ime ka ọ malite igosi otú ihe ahụ o mere ji dị mma. Kama ikwuwe ihe ndị ahụ, jiri nwayọọ gwa ya otú obi dị gị banyere ihe o mere.