Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha

IHE BỤ́ NSOGBU

Ka e were ya na e nwere otu nwaanyị nwa ya dị afọ ise. Ka nwa ahụ nọ n’ime ụlọ na-egwu egwu, nwaanyị ahụ nụrụ ka ihe dara n’ala kụwaa. Mgbe ọ batara, ọ hụrụ ebe nwa ahụ kwụ n’akụkụ ihe ahụ. Otú ihu ya dị agwala ya na ọ bụ ya kụwara ya.

Ya ejiri iwe jụọ ya, sị: “Ònye kụwara ihe a?”

Ya azaa ya ozugbo, sị: “Amaghị m.”

Ihe a abụghị nke mbụ ọ na-agha ụgha. Ọ bụrụ na ọ bụ gị mụrụ nwa ahụ, ì chere na ọ gaghị akwụsịli ịgha ụgha?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

E nweghị ụgha dị mma. Baịbụl kwuru na Jehova Chineke kpọrọ “ire na-agha ụgha” asị. (Ilu 6:16, 17) Dị ka ihe atụ, Iwu Mozis kwuru ahụhụ a ga-ata onye ghọrọ mmadụ ibe ya aghụghọ.—Levitikọs 19:11, 12.

Ma, e nwere ụgha ndị ka ibe ha njọ. E nwere ụfọdụ ụgha jọgburu onwe ha. A na-agha ha iji mebie aha mmadụ ma ọ bụ mesie mmadụ ike. Ma, ụfọdụ ndị na-agha ụgha mgbe ha nọ ná nsogbu. O nwere ike ịbụ ka a ghara ịta ha ahụhụ ma ọ bụ ka a ghara imenye ha ihere. (Jenesis 18:12-15) N’agbanyeghị na e nweghị ụgha nke dị mma, e nwere ndị ka ibe ha njọ. Nwa gị ghaa ụgha, mata ihe mere o ji ghaa ya, burukwa afọ ole ọ dị n’obi.

Nyere nwa gị aka mgbe ọ ka dị obere. Otu nwoke aha ya bụ David Walsh kwuru na ụmụaka kwesịrị ịmụta ịna-ekwu eziokwu, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ gaghị adịrị ha mfe. Mmadụ kwesịrị ịtụkwasị onye ya na ya dị ná mma obi. Ma ọ bụrụ na onye ahụ na-aghakarị ụgha, ọ gaghị atụkwasịli ya obi.

Echela na nwa gị agaghị agbanweli. Na nwa gị tụrụ asị apụtaghị na ọ ghọọla ajọ nwa. Cheta na Baịbụl sịrị na e kekọtara nzuzu na obi nwata. (Ilu 22:15) Otú ụfọdụ ụmụaka si egosi nzuzu nke ha bụ ịtụ asị. Ha nwere ike iche na ọ ga-eme ka a ghara ịta ha ahụhụ. N’ihi ya, i kwesịrị ilezi anya mara ihe ị ga-eme ya.

IHE I NWERE IKE IME

Chọpụta ihe mere nwa gị ji agha ụgha. Ọ̀ bụ ụjọ ihe a ga-eme ya na-atụ ya, ka ọ̀ bụ na ọ chọghị ime ihe ga-ewe gị iwe? Ọ bụrụ na nwa gị na-akọrọ ndị enyi ya ihe na-abụghị eziokwu ka ha ghara ileda ya anya, ihe mere o ji akọrọ ha ya ọ̀ bụ maka na ọ ghọtabeghị otú ihe si dị n’ụwa? Ọ bụrụ na ị mata ihe mere nwa gị ji agha ụgha, ị ga-enwe ike ịma otú ị ga-esi enyere ya aka.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Ndị Kọrịnt 13:11.

Gwa ya ihe o mere, kama ịjụ ya ajụjụ. N’ihe atụ ahụ e nyere ná mbido isiokwu a, o doro nwaanyị ahụ anya na ọ bụ nwa ya kụwara ihe ahụ. Ma, ọ jụrụ ya, sị: “Ònye kụwara ihe a?” O nwere ike ịbụ na ihe mere nwa ahụ ji sị na ya amaghị bụ na ọ hụrụ na iwe ji mama ya. Ma, kama ịjụwa ya ajụjụ, mama ya gaara asị ya: “Hei, ị kụwaala ihe a.” Ọ bụrụ na ọ gwa nwa ya ihe o mere kama ịjụ ya ajụjụ, nwa ahụ agaghị atụ asị, kama ọ ga-enyere ya aka ịmụta ịna-ekwu eziokwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:9.

Nwa gị kwuo eziokwu, jaa ya mma. Ụmụaka na-achọkarị ime ihe ga-atọ mama ha na papa ha ụtọ. N’ihi ya, mee ka nwa gị mata na obi ga-atọ gị ụtọ ma ọ na-ekwu eziokwu. Kụziere ya na ezinụlọ unu ejighị ikwu eziokwu eti epele nakwa na ị chọrọ ka ọ na-ekwu eziokwu mgbe niile.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Hibru 13:18.

Mee ka nwa gị ghọta na a naghị atụkwasị onye ụgha obi nakwa na a kwụsị ịtụkwasị mmadụ obi, ọ na-esi ike tupu a malite ịtụkwasị onye ahụ obi ọzọ. Mgbe ọ bụla o kwuru eziokwu, jaa ya mma. Ime otú a ga-eme ka ọ na-agba mbọ na-ekwu eziokwu. Dị ka ihe atụ, o kwuo eziokwu, i nwere ike ịsị ya, “Obi dị m ụtọ na ị na-ekwu eziokwu.”

Na-ekwu eziokwu. O doro anya na ị gaghị atụ anya na nwa gị ga na-ekwu eziokwu ma ọ bụrụ na gịnwa anaghị ekwu eziokwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ị na-achọghị ịhụ achọrọ gị bịa, gị agwa nwa gị ka ọ gwa ya na ị nọghị ya, ị na-akụziri ya ịtụ asị.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 3:17.

Kụziere ya ihe Baịbụl kwuru. Ihe ndị dị na Baịbụl na akụkọ ndị a kọrọ na ya gosiri na Chineke chọrọ ka anyị na-ekwu eziokwu. Akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara nke aha ya bụ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ga-enyere gị aka ịkụziri nwa gị ihe ndị dị na Baịbụl. Isiokwu nke 22 bụ “Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha.” (Gụọ ihe ụfọdụ si n’isiokwu a n’igbe bụ́ “ Akwụkwọ Ga-enyere Nwa Gị Aka.”) Akwụkwọ