Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ego

Ego

Nsogbu ọtụtụ ndị na-enwe banyere ego ebelatala n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru.

NA-EME EZIGBO ATỤMATỤ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.”—Ilu 21:5.

IHE Ọ PỤTARA: I mee atụmatụ, mezuokwa ya, ọ ga-eme ka ihe na-agaziri gị. N’ihi ya, tupu gị emefuwa ego, buru ụzọ hazie otú ị ga-esi emefu ya. Cheta na ọ bụghị ihe niile ị chọrọ ka ị ga-azụtali. N’ihi ya, chee echiche nke ọma tupu gị emefuwa ego.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Kpebie ego ole ị ga na-emefu, na-emekwa ihe i kpebiri. Depụta otú ị chọrọ isi emefu ego gị, haziekwa ha ahazie. Dị ka ihe atụ, depụta ego ole ị ga-emefu ná nri, n’uwe nakwa n’ịkwụ ụgwọ ụlọ. Ọ bụrụ na ego i mefuru n’otu ihe karịrị ihe ị chọrọ imefu na ya, si n’ego i wepụtara maka ihe ọzọ dochie ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i mefuru ego karịrị akarị n’ịzụ mmanụ ụgbọala, si n’ego i wepụtara maka ihe ndị ọzọ na-adịchaghị mkpa, dị ka ego i ji azụ ihe mmegharị ọnụ, dochie ya.

  • Gbalịa zere ịna-eji ụgwọ. Ọ bụrụ na o kwe mee, zere iji ụgwọ chaa chaa. Kama iji ụgwọ, chekwawa ego gị ruo mgbe o zuru ihe ị chọrọ ịzụ. Ná mba ụfọdụ, ọ na-abụ mmadụ jiri kaadị e ji azụ ihe n’aka zụọ ihe ma ọ́ kwụghị ya ma ọnwa gwụ, a naa ya ọmụrụ nwa. Ọ bụrụ na ị na-esi otú a azụ ihe, gbalịa kwụchaa ego i ji n’ụgwọ ma ọnwa gwụ ka ị ghara ịkwụ ọmụrụ nwa. Ọ bụrụ na i ji ụgwọ, hazie otú ị ga-esi akwụghachi ya, gbaakwa mbọ kwụọ ya.

    Otu nchọpụta e mere gosiri na iji kaadị e ji azụ ihe n’aka azụ ihe na-eme ka ndị mmadụ na-emefukarị ego. N’ihi ya, ọ bụrụ na i nwere kaadị e ji azụ ihe n’aka, azụla ihe ọ bụla ị hụrụ.

ZERE ÀGWÀ NDỊ NWERE IKE ỊKPATARA GỊ NSOGBU

IHE BAỊBỤL KWURU: “N’ihi oge oyi, onye umengwụ agaghị akọ ihe; ọ ga na-arịọ arịrịọ n’oge owuwe ihe ubi, ma ọ dịghị ihe ga-adị.”—Ilu 20:4.

IHE Ọ PỤTARA: Umengwụ nwere ike ime ka mmadụ daa ogbenye. N’ihi ya, na-arụsi ọrụ ike, zerekwa imefusi ego aghara aghara ka i nwee ego ị ga-eji eme ihe ndị dị gị mkpa n’ọdịnihu.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-arụsi ọrụ ike. Na-arụsi ọrụ ike, bụrụkwa onye a ga-atụkwasịli obi n’ọrụ gị. Ọ ga-eme ka ndị were gị n’ọrụ jiri gị kpọrọ ihe ma ghara ịchụ gị n’ọrụ.

  • Na-akwụwa aka ọtọ. Ezula onye ị na-arụrụ ọrụ ohi. Akwụwaghị aka ọtọ nwere ike ime ka i nwee aha ọjọọ, meekwa ka o siere ndị mmadụ ike inye gị ọrụ.

  • Adịla anyaukwu. Ịchụ ego ọnwụ ọnwụ nwere ike ime ka ị daa ọrịa, mebiekwa adịm ná mma gị na ndị ọzọ. Cheta na ego abụghị ihe niile.

IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU

I nwere ike ịgụ Baịbụl na jw.org n’ọtụtụ narị asụsụ

EJILA EGO GỊ NA OGE GỊ EME IHE NDỊ NA-ABAGHỊ URU.

“Onye aṅụrụma na onye na-eribiga nri ókè ga-ada ogbenye, ụra ga-eme ka mmadụ yiri naanị nkịrịka ákwà.”—ILU 23:21.

ECHEGBULA ONWE GỊ.

“Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.”—MATIU 6:25.

ENWELA ANYAỤFỤ.

“Onye anyaụfụ na-achụsosi ihe dị oké ọnụ ahịa ike, ma ọ maghị na ya ga-anọ n’ụkọ.”—ILU 28:22.