Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị a na-ebibighị mgbe oge ikpeazụ ga-agwụ ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ànyị bi “n’oge ikpeazụ”?

Gịnị ka ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl kwuru

“N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Amụma ndị e buru na Baịbụl na ihe ndị na-eme n’oge anyị a na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • A ga na-alụ agha n’ebe dị iche iche, nweekwa ụkọ nri, ala ọma jijiji na ajọ ọrịa na-efe efe n’oge ikpeazụ.—Matiu 24:3, 7; Luk 21:11.

  • Baịbụl kwuru na n’oge ikpeazụ, àgwà ndị mmadụ ga-eretọ eretọ, kwuokwa na ha agaghịzi eji ofufe Chineke kpọrọ ihe.—2 Timoti 3:2-5.

Olee otú ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ n’ọdịnihu?

Ụfọdụ ndị na-ekwu . . . na oge ikpeazụ ga-agwụ mgbe Chineke ga-ebibi ụwa na mmadụ niile bi na ya, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ihe ga-emecha dị mma n’ụwa. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”Abụ Ọma 37:29.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Oge ikpeazụ ga-agwụ mgbe Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ niile kwụsị.—1 Jọn 2:17.

  • A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Aịzaya 35:1, 6.