Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịlafere Afọ Mbụ nke Alụmdi na Nwunye

Ịlafere Afọ Mbụ nke Alụmdi na Nwunye

Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Ịlafere Afọ Mbụ nke Alụmdi na Nwunye

Nke nwoke kwuru, sị: “O juru m anya ịchọpụta na àgwà mụ na nwunye m dị nnọọ iche! Dị ka ihe atụ, ọ na-amasị m iteta ụra n’oge, ma ọ naghị achọ ịlaba ngwa ngwa. Ọ na-agbagwoju m anya otú obi ga-esi dị ya mma ugbu a, ma n’otu ntabi anya, obi ajọwa ya njọ! O nwekwara ihe ọzọ—m sie nri, ọ na-emekarị mkpesa, karịchaa banyere otú m si eji ákwà e ji ehicha efere ehicha aka.”

Nke nwaanyị kwuru, sị: “Di m abụghị onye oké okwu. Ma, ezinụlọ m amarala m ahụ́. Ha na-ekwu oké okwu, karịchaa n’oge nri. Mgbe di m na-esikwa nri, ọ na-eji otu ákwà ehicha ma efere ma aka ya! Ọ na-ewe m iwe! Gịnị mere o ji esi nnọọ ike ịghọta ụmụ nwoke? Olee otú ndị mmadụ si enwe ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye ha?”

Ọ BỤRỤ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ọhụrụ, ì nwetụla ụdị nsogbu ndị a? Ọ̀ dị gị ka à ga-asị na di ma ọ bụ nwunye gị amụtala àgwà ọjọọ ndị ọ na-enwebughị mgbe unu na-akpa? Olee otú i nwere ike isi mee ka “nsogbu ndị lụrụ di na nwunye ga na-enwe kwa ụbọchị” ghara itisa alụmdi na nwunye unu?—1 Ndị Kọrịnt 7:28, Today’s English Version.

Nke mbụ, echela na naanị n’ihi na unu agbaala akwụkwọ, gị na di ma ọ bụ nwunye gị aghọọla aka ochie n’alụmdi na nwunye. O nwere ike ịbụ na ị mụtara nkà ndị na-enye aka ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, o nwekwara ike ịbụ na nkà ndị ahụ kakwuru mma mgbe unu na-akpa. Ma, alụmdi na nwunye ga-anwale nkà ndị ahụ n’ụzọ ndị ị na-ahụtụbeghị, o nwekwara ike ịchọ gị n’aka ịmụta nkà ndị ọhụrụ. Ị̀ ga-emehie ihe? Eenụ. Ì nwere ike ịmụta nkà ndị dị gị mkpa? I nwere nnọọ ike!

Ụzọ kacha mma isi mee ka nkà ọ bụla ka mma bụ ịkpọtụrụ onye bụ́ aka ochie na nkà ahụ na ime ihe ọ gwara gị mee. Onye kacha bụrụ aka ochie n’alụmdi na nwunye bụ Jehova Chineke. A si ka e kwuwe, ọ bụ Ya kere anyị inwe mmasị ịlụ di ma ọ bụ nwunye. (Jenesis 2:22-24) Tụlee otú Okwu ya, bụ́ Baịbụl, nwere ike isi nyere gị aka imeri nsogbu dị iche iche ma mụta nkà ndị dị gị mkpa iji mee ka alụmdi na nwunye gị lafere afọ nke mbụ ya.

NKÀ 1. MỤTANỤ ỊGBARỊTA IZU

Olee ihe ndị mere o ji esi ike? Keiji, * bụ́ nwoke bi na Japan, na-echefu mgbe ụfọdụ na mkpebi ndị ọ na-eme na-emetụta nwunye ya. O kwuru, sị: “M na-ekweta ịga ebe ụfọdụ n’ajụghị nwunye m ajụ. E mechaa, mụ achọpụta na ọ gaghị adịrị ya mfe ịga.” Allen, bụ́ nwoke bi n’Ọstrelia, kwuru, sị: “Echere m na ịjụta echiche nwunye m ga-egosi na abụghị m nwoke.” O siiri ya ike n’ihi otú e si zụlite ya. Ihe yiri nke ahụ mere Dianne, bụ́ onye bi na Briten. O kwuru, sị: “Ọ maara m ahụ́ ịjụ ezinụlọ m ihe m ga-eme. N’ihi ya, na mbụ, m na-akpọtụrụ ha kama ịkpọtụrụ di m mgbe m na-achọ ime mkpebi.”

Gịnị ga-agwọta ya? Cheta na Jehova Chineke na-ele di na nwunye anya ka “otu anụ ahụ́.” (Matiu 19:3-6) N’anya ya, o nweghị mmekọrịta dị n’etiti mmadụ abụọ dị mkpa karịa nke dị n’etiti di na nwunye! Iji mee ka mmekọrịta ahụ nọgide na-esi ike, ọ dị mkpa ka di na nwunye na-ekwurịta okwu nke ọma.

Di na nwunye nwere ike ịmụta ihe dị ukwuu site n’ịtụle otú Jehova Chineke na Ebreham si kwurịta okwu. Dị ka ihe atụ, biko gụọ okwu Chineke na Ebreham kwurịtara nke dị na Jenesis 18:17-33. Ị̀ hụrụ na ọ dị ụzọ ihe atọ Chineke mere iji kwanyere Ebreham ùgwù? (1) Jehova kọwara ihe ọ chọrọ ime. (2) O gere ntị ka Ebreham na-ekwu ihe o chere. (3) Ruo n’ókè o kwere mee, Jehova gbanwere ihe ọ chọrọ ime iji meere Ebreham ihe ọ chọrọ. Olee otú i nwere ike isi mee otú ahụ mgbe ị na-ajụ di ma ọ bụ nwunye gị echiche ya?

MEGODỊ IHE A: Mgbe gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-ekwurịta ihe ga-emetụta ya, (1) kọwaara ya ihe ị ga-achọ ime n’okwu ahụ, ma kwuo ya dị ka aro, ọ bụghị dị ka mkpebi i merela eme ma ọ bụ iwu; (2) jụọ di ma ọ bụ nwunye gị ihe o chere, meekwa ka ọ mara na echiche ya nwere ike ịdị iche na nke gị; (3) ‘meekwa ka a mara na i nwere ezi uche’ site n’ime ihe di ma ọ bụ nwunye gị chọrọ mgbe ọ bụla o kwere mee.—Ndị Filipaị 4:5.

NKÀ NKE 2. MỤTA IJI AKỌ EKWU OKWU

Olee ihe mere o ji esi ike? Ezinụlọ a zụlitere gị na ya ma ọ bụ omenala obodo gị nwere ike ime ka ị na-eji olu ike ekwu echiche gị, ma ọ bụdị na-ekwu okwu n’echeghị echiche. Dị ka ihe atụ, Liam, bụ́ onye bi na Yurop, kwuru, sị: “N’ebe a mụrụ m, ndị mmadụ na-ekwukarị okwu n’echebaraghị ndị ọzọ echiche. Otú m si ekwu uche m n’echebaraghị nwunye m echiche na-ewutekarị ya. M gbalịrị mụta iji nwayọọ ekwu okwu.”

Gịnị ga-agwọta ya? Echela nnọọ na di ma ọ bụ nwunye gị ga-achọ ka ị na-agwa ya okwu otú maara gị ahụ́. (Ndị Filipaị 2:3, 4) Ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere onye na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ ga-enyekwara di na nwunye lụrụ ọhụrụ aka. O dere, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ.” N’asụsụ Grik mbụ, e nwekwara ike ịsụgharị okwu a sụgharịrị “n’ụzọ dị nwayọọ” “ịdị akọ.” (2 Timoti 2:24) Ịdị akọ bụ ịmata mgbe okwu nwere ike ịkpata esemokwu ma jiri nwayọọ kwuo okwu, n’akpasughị mmadụ iwe.

MEGODỊ IHE A: Mgbe ị na-eweso di ma ọ bụ nwunye gị iwe, kama iwere ya na ị na-agwa di ma ọ bụ nwunye gị okwu, weregodị ya na ọ bụ ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye were gị n’ọrụ ka ị na-agwa okwu. Ị̀ ka ga-eji olu ahụ ị chọrọ iji gwa ya okwu agwa ya okwu ma ọ bụ ị̀ ka ga-agwa ya otu ihe ahụ ị chọburu ịgwa ya? Chezie echiche banyere ihe ndị mere i kwesịrị iji jiri nkwanye ùgwù na akọ gwa di ma ọ bụ nwunye gị okwu karịa enyi gị ma ọ bụ onye were gị n’ọrụ.—Ndị Kọlọsi 4:6.

NKÀ NKE 3. KA ỌRỤ ỌHỤRỤ UNU MARA UNU AHỤ́

Olee ihe mere o ji esi ike? Ná mmalite, di nwere ike ghara ịrụ ọrụ ya nke ọma dị ka onyeisi ma ọ bụ o nwere ike ịbụ na ọ mabeghị nwaanyị ahụ́ iji akọ atụrụ di ya aro. Dị ka ihe atụ, otu nwoke bi n’Ịtali nke aha ya bụ Antonio kwuru, sị: “Ọ na-esi ike nna m ajụta echiche nne m tupu ya emee mkpebi metụtara ezinụlọ anyị. N’ihi ya, ná mmalite, m nọ na-achị ezinụlọ m ka à ga-asị na m bụ eze.” Debbie, bụ́ nwaanyị lụrụ di bi na Kanada, kwuru, sị: “M na-agwa di m na ọ ga na-edebekwu ihe ọcha. Ma otú m si agwa ya okwu ahụ ka ọga yiri ka ò mere ka ọ na-agbakwu isi akwara.”

Gịnị ga-enyere di aka imeri ya? Ụfọdụ ndị bụ́ di na-eche na ihe Baịbụl kwuru banyere nwaanyị ido onwe ya n’okpuru di ya na ihe o kwuru banyere nwata irubere nne ya ma ọ bụ nna ya isi bụ otu. (Ndị Kọlọsi 3:20; 1 Pita 3:1) Ma, Baịbụl kwuru na di ‘ga-arapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ abụrụkwa otu anụ ahụ́’; o kwughị otu ihe ahụ banyere nne ma ọ bụ nna na nwa ya. (Matiu 19:5) Jehova kwuru na nwaanyị bụ onye ga-eme ka di ya zuo ezuo ma ọ bụ onye ya na ya na-arụkọ ọrụ. (Jenesis 2:18) Ọ dịghị ebe o kwuru na nwata bụ onye ga-eme ka nne ma ọ bụ nna ya zuo ezuo ma ọ bụ onye ya na nne ma ọ bụ nna ya na-arụkọ ọrụ. Olee ihe i chere—ọ bụrụ na di ana-emeso nwunye ya ihe ka nwatakịrị, ọ̀ na-akwanyere ndokwa alụmdi na nwunye ùgwù?

N’ezie, Okwu Chineke dụrụ gị ọdụ ka ị na-emeso nwunye gị otú ahụ Jizọs si emeso ọgbakọ Ndị Kraịst. I nwere ike ime ka ọ dịkwuoro nwunye gị mfe iwere gị dị ka onyeisi ya ma ọ bụrụ na (1) ị naghị atụ anya ka o gosi ozugbo na ọ na-edo onwe ya n’okpuru gị n’emejọghị ihe ọ bụla nakwa ma ọ bụrụ na (2) gị ahụ ya n’anya dị ka ahụ́ nke onwe gị, ọbụna mgbe unu nwere nsogbu.—Ndị Efesọs 5:25-29.

Gịnị ga-enyere nwunye aka imeri ya? Ghọta na di gị bụzi onye Chineke họpụtara ịbụ onyeisi gị. (1 Ndị Kọrịnt 11:3) Ọ bụrụ na ị na-asọpụrụ di gị, ị na-asọpụrụ Chineke. Ọ bụrụ na ị jụ ịbụisi ya, ọ na-egosi, ọ bụghị naanị otú i si ele di gị anya, kamakwa otú i si ele Chineke na iwu ya anya.—Ndị Kọlọsi 3:18.

Mgbe unu na-ekwurịta nsogbu ndị tara akpụ, mụta ilekwasị anya n’otú unu ga-esi merie nsogbu ndị ahụ—ọ bụghị ịkatọwa di gị. Dị ka ihe atụ, Eze Nwaanyị Esta chọrọ ka di ya, bụ́ Eze Ahazuirọs, kpezie otu ikpe na-ezighị ezi e kpere. Kama ịkatọwa di ya, o ji akọ kwuo ihe dị ya n’obi. Di ya nabatara aro ya ma mechaa mezie ihe ahụ e mejọrọ. (Esta 7:1-4; 8:3-8) O yiri ka di gị ọ̀ ga-aka amụta ịhụ gị n’anya nke ukwuu ma ọ bụrụ na (1) i nye ya oge ịmụta ọrụ ọhụrụ ya dị ka onyeisi ezinụlọ nakwa (2) ma ọ bụrụ na ị na-akwanyere ya ùgwù, ọbụna mgbe o mejọrọ ihe.—Ndị Efesọs 5:33.

MEGODỊ IHE A: Kama ịnọ na-edetu ebe ndị i chere di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị imezi, na-edetu ebe ndị i kwesịrị imezi. Ndị bụ́ di: Mgbe ị kpasuru nwunye gị iwe n’ihi otú i si jiri ikike gị mee ihe dị ka onyeisi ezinụlọ ma ọ bụ otú i si ghara iji ya mee ihe, jụọ ya otú i nwere ike isi mezikwuo, detuzie aro ndị ọ tụụrụ gị edetuo. Ndị bụ́ nwunye: Mgbe di gị kwuru na ị naghị akwanyere ya ùgwù, jụọ ya otú i nwere ike isi mezikwuo, burukwa aro ndị ọ tụụrụ gị n’uche.

Atụla Anya Ihe Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-agaghị Emeli

Ịmụ otú mmekọrịta gị na di ma ọ bụ nwunye gị ga-esi dị mma na otú unu ga-esi na-akwanyere ibe unu ùgwù yiri ịmụ ịgba ígwè. Ị ga-atụ anya na ị ga-ada ugboro ole na ole ka ị na-amụta ịgba ígwè. N’otu aka ahụ, i kwesịrị ịtụ anya imejọ ihe ụfọdụ, bụ́ nke ga-eme gị ihere, ka ị na-amụta ọrụ gị n’ezinụlọ.

Na-eme ihe ọchị. Jiri ihe ndị na-ewute di ma ọ bụ nwunye gị kpọrọ ihe, ma mụta ịchị onwe gị ọchị mgbe i mejọrọ ihe. Jiri ohere ọ bụla dapụtara n’afọ mbụ nke alụmdi na nwunye unu mee di ma ọ bụ nwunye gị obi ụtọ. (Diuterọnọmi 24:5) Nke ka nke, kwe ka Okwu Chineke na-eduzi mmekọrịta unu. Ọ bụrụ na unu emee otú ahụ, alụmdi na nwunye unu ga na-esikwu ike kwa afọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

▪ Èmeela m di ma ọ bụ nwunye m onye m kasị akọrọ ihe nzuzo m, ka m̀ na-ahọrọ ịkọrọ ya ndị ọzọ?

▪ Kemgbe ụnyaahụ, olee otu ihe m merela nke na-egosi na m hụrụ di ma ọ bụ nwunye m n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11, 12]

Baịbụl Zọrọ Alụmdi na Nwunye Anyị

Toru na Akiko hụrụ ibe ha n’anya mgbe ha lụrụ. Ma, naanị ọnwa asatọ di na nwunye a bụ́ ndị Japan lụchara, ha kpebiri ịgba alụkwaghịm. Ha kọrọ ihe merenụ.

Toru: “Achọpụtara m na àgwà mụ na nwunye m ekwekọghị otú m chere. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ele televishọn, ọ na-amasị m ile egwuregwu, ma, ọ na-amasị ya ile ihe nkiri. Ọ na-amasị m ịpụ apụ, ma, ọ na-amasị ya ịnọ n’ụlọ.”

Akiko: “Toru na-eme ihe ọ bụla ezinụlọ ya gwara ya mee, ma ọ naghị ajụ m. M jụrụ ya, sị, ‘Olee onye ka gị mkpa, nne gị ka ọ̀ bụ m?’ Otú Toru si etinye okwu nnu na ose wụkwara m akpata oyi n’ahụ́. Agwara m ya na otu ụgha na-eduga n’ụgha ọzọ nakwa na ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ya, alụmdi na nwunye anyị ga-atọsa.”

Toru: “Ike gwụrụ m, mụ ajụọkwa otu onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nke ka m n’ọkwá ihe m ga-eme banyere nwunye m. O kwuru, sị, ‘Naanị ihe ị ga-eme bụ ịgwa ya mechie ọnụ. Ya jụ, kụtuo ya.’ Otu ụbọchị, amara m Akiko ụra ma kpuo tebụl anyị ihu. Mụ na ya lụrụ ezigbo ọgụ, ya esikwa n’ụlọ pụọ. Esi m n’otu họtel dị na Tokyo kpọlata ya. Anyị mechara kpebie ịgba alụkwaghịm. Ka m gawara ọfịs n’ụtụtụ ahụ, nwunye m malitere ịkwakọ ihe ya.”

Akiko: “Mgbịrịgba ọnụ ụzọ anyị kụrụ ka m na-ebupụ akpa m. Otu nwaanyị guzo n’ọnụ ụzọ anyị. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Agwara m ya batawa.”

Toru: “Mgbe m rutere n’ọfịs m, anọ m na-enwe obi abụọ banyere ịgba alụkwaghịm ahụ, n’ihi ya, emere m ngwa ngwa laghachi n’ụlọ. Mgbe m rutere, ahụrụ m Akiko ka ya na nwaanyị a na-ekwurịta okwu. Nwaanyị ahụ sịrị m: ‘Ọ dị unu mkpa inwe ihe unu abụọ ga na-emekọ ọnụ. Ị̀ ga-achọ ịmụ Baịbụl?’ Azara m ya, sị: ‘Ee, achọrọ m ihe ọ bụla ga-eme ka alụmdi na nwunye anyị ghara ịtọsa!’”

Akiko: “Nwaanyị ahụ mere ndokwa ka a mụwara anyị Baịbụl. Ihe gbanwere ndụ anyị bụ mgbe anyị gụrụ otú Baịbụl si kọwaa ndokwa alụmdi na nwunye. Ọ sịrị: ‘Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ.’”—Jenesis 2:24.

Toru: “Aghọtara m ihe ebe ahụ na-ekwu ozugbo. Agwara m ndị mụrụ m, sị, ‘Malite ugbu a gawa, mụ na nwunye m ga na-ekwurịta ihe m chọrọ ime tupu mụ emee mkpebi.’ Akwụsịkwara m ịṅụ oké mmanya. Mgbe m mụtakwara na Chineke kpọrọ ụgha asị, agbawara m mbọ ikwu naanị eziokwu.”

Akiko: “M gbanwekwara àgwà m. Dị ka ihe atụ, m na-enupụburu Toru isi. Ma, mgbe m hụrụ otú o si na-etinye ụkpụrụ Baịbụl n’ọrụ, amalitere m ịkwadokwu ya. (Ndị Efesọs 5:22-24) Anyị alụọla ihe karịrị afọ iri abụọ na asatọ, anyị na-enwekwa obi ụtọ. Anyị meriri nsogbu anyị site n’ịmatakwu onwe anyị na itinye ezi ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl n’ọrụ.”