Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Kuru Nwa Gị”

“Kuru Nwa Gị”

Bịaruo Chineke Nso

“Kuru Nwa Gị”

2 NDỊ EZE 4:8-37

ỌNWỤ nwatakịrị so n’ihe ndị kacha agbawa obi nwere ike ịdabara mmadụ. Jehova Chineke nwere ike ịkpọliteghachi onye nwụnahụrụ mmadụ. Anyị maara na nke a bụ eziokwu n’ihi na o nyere mmadụ ole na ole dịrị ndụ n’oge Baịbụl ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Otu akụkọ a kọrọ ná 2 Ndị Eze 4:8-37 kọrọ banyere otu nwatakịrị nwoke Ịlaịsha onye amụma kpọlitere n’ọnwụ.

Akụkọ ahụ mere n’obodo Shunem. Otu nwaanyị aga na di ya mesoro Ịlaịsha omume obiọma, na-enye ya nri na ebe obibi mgbe niile. Otu ụbọchị, onye amụma ahụ obi dị ụtọ gwara nwaanyị ahụ, sị: “N’ụdị oge a n’afọ ọzọ ị ga na-amakụ nwa.” Ụbọchị ahụ nwaanyị ahụ na-atụghị anya na ọ ga-abịa mechara bịa, dịkwa ka Ịlaịsha kwuru, o ku nwa nwoke n’aka. Ọ dị mwute na ọṅụ ya adịteghị aka. Mgbe afọ ole na ole gachara, oké isi ọwụwa wawara nwata nwoke ahụ n’ubi, e kulatakwa ya n’ụlọ, bụ́ ebe ọ nwụrụ “n’ikpere [nne ya].” (Amaokwu 16, 19, 20) Nwaanyị ahụ nwa ya nwụrụ kulitere ozu obere nwa ya ma nyiwe ya n’ihe ndina, bụ́ ebe onye amụma ahụ na-ehi ọtụtụ mgbe.

N’egbughị oge, nwaanyị ahụ naara di ya ike ma mee njem dị ihe dị ka iri kilomita atọ gaa n’Ugwu Kamel ịhụ Ịlaịsha. Mgbe o zutere Ịlaịsha, o beghị ákwá ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ gosi na ọ na-eru oké uju. Ọ̀ bụ n’ihi na ọ nụla na Ịlaịja, bụ́ onye Ịlaịsha nọchiri, kpọlitere nwa nke otu nwaanyị di ya nwụrụ n’ọnwụ? (1 Ndị Eze 17:17-23) Nwaanyị Shunem a ò nwere okwukwe na Ịlaịsha nwere ike ịkpọlitekwa nwa ya nwoke n’ọnwụ? Nke ọ bụla ọ bụ, ọ jụrụ ịlawa ruo mgbe Ịlaịsha kwere iso ya.

Mgbe ha ruru Shunem, Ịlaịsha banyere naanị ya n’ụlọ ahụ ọ maara nke ọma ma hụ ozu ahụ “n’ihe ndina ya.” (Amaokwu 32) Onye amụma ahụ kpegaara Jehova ekpere na-aghaghị ịbụ na ọ rịọsiri ya arịrịọ ike na ya. Ka Ịlaịsha ji ozu nwa ahụ aka, “ahụ́ nwata ahụ wee kporo ọkụ.” Obi nwatakịrị ahụ malitere ịkụ ọzọ! Ịlaịsha kpọrọ nne ya ma kwuo okwu a nke ọ na-aghaghị ịbụ na o mere ka iru uju nwaanyị ahụ ghọọ oké ọṅụ: “Kuru nwa gị.”—Amaokwu 34, 36.

Akụkọ banyere mkpọlite a kpọlitere nwa nwoke nwaanyị Shunem ahụ n’ọnwụ na-enye anyị olileanya ma na-akasi anyị obi. Jehova na-aghọta mwute nne na nna nwa ha nwụrụ na-enwe. E wezụga nke ahụ, ọ na-agụ ya agụụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Job 14:14, 15) Mkpọlite Ịlaịsha na ndị ọzọ dịrị ndụ n’oge Baịbụl kpọlitere ụfọdụ ndị n’ọnwụ na-atụpenye anyị azụ̀ ihe ka nnọọ ukwuu Jehova ga-eme n’ụwa ọhụrụ ezi omume ya na-abịanụ. *

Nkwa mbilite n’ọnwụ Baịbụl kwere anaghị ewepụ mwute mmadụ na-enwe mgbe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ. Otu nwoke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Onye Kraịst, nke otu mkpụrụ nwa ya nwụrụ, kwuru, sị: “Mwute m na-enwe agaghị akwụsịcha ruo mgbe m nwere ike ịmakụ nwa m ọzọ.” Cheedị otú obi ga-adị gị mgbe ị ga-ahụ ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ. Naanị icheta otú ọ ga-adị gị ịmakụ ha ọzọ nwere ike ibelata ihe mgbu ị na-enwe. Ì nwere mmasị ịmụtakwu banyere Chineke nke nyere anyị olileanya a magburu onwe ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa mbilite n’ọnwụ Baịbụl kwere, gụọ isi nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.