Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE otú otu nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ na Rọshịa bụ́ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ si kwụsị àgwà ọjọọ ahụ ma mee ka ya na ụmụ ya dịkwuo ná mma? Olee otú nwoke na-enweghị ebe o bi na Kioto, Japan, si nwee ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị mere ka ọ daa ogbenye? Olee ihe nyeere otu onye Ọstrelịa na-achị ehi aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya? Tụlee ihe ha kwuru.

‘Amụtara m na ọ bụ ọrụ dịịrị m ilekọta onwe m.’—NELLY BAYMATOVA

ADỊ M AFỌ: 45

ABỤ M ONYE: RỌSHỊA

NDỤ M BIRI: ỌGWỤ ỌJỌỌ RIRI M AHỤ́

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m na Vladikavkaz, bụ́ isi obodo mba Nọt Osisha (bụ́zi Alania). Ezinụlọ anyị batụrụ ọgaranya. Ma, n’agbanyeghị na ego akọghị m, enweghị m obi ụtọ. Ka m na-erule iri afọ atọ na anọ, agbaala m alụkwaghịm ugboro abụọ. Aṅụọla m ọgwụ ọjọọ riri m ahụ́ afọ iri, a gwọọkwa m ya ugboro abụọ n’ụlọ ọgwụ. Ọ bụ ezie na m nwere ụmụ abụọ, ahụghị m ha n’anya mgbe ahụ; mụ na ndị ikwu na ibe m adịkwaghị ná mma.

Nne m aghọọla Onyeàmà Jehova, m na-anụkwa ugboro ugboro ka ọ na-ebe ákwá n’ihi m, na-arịọ Jehova ka o nyere m aka. M na-eche n’obi m, sị, ‘Nne m amadịghị nke a na-akọ! Olee otú Jehova ga-esi nyere m aka?’ Agbalịrị m ịhapụ ọgwụ ọjọọ. Ma, akwụsịlighị m ya n’onwe m. Ọ dị mgbe m na-aṅụghị ọgwụ ọjọọ ruo abalị abụọ. M kpebiziri na m kwesịrị isi n’ụlọ pụọ, m sizie na windo mapụ. Ihe ọjọọ mere m bụ na m nọ n’ụlọ elu. Ada ahụ m dara gbajiri m aka na ụkwụ, merụọkwa m ahụ́ n’azụ. Anọrọ m n’ute ọrịa ihe karịrị otu ọnwa.

Ka m na-agbake, nne m lekọtara m, ọ katọghịkwa m. Ọ ghọtara na obi jọrọ m njọ n’oge ahụ. Ma, ọ hapụụrụ m magazin Teta! * ụfọdụ n’akụkụ àkwà m ka m gụọ. Agụrụ m ha niile ma chọpụta na ha dị ụtọ ma na-akụziri nnọọ mmadụ ihe. Ekpebiziri m ka Ndịàmà mụwara m Baịbụl.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Otu ihe Baịbụl kụziiri m bụ ịrụ ọrụ dịịrị m. Kama ịtụ anya ka nne m lekọtawa m, amụtara m na ọ bụ ọrụ dịịrị m ịkpata ego m ga-eji na-elekọta onwe m na ụmụ m. Mgbe m mecharala otú ọ sọrọ m ruo ogologo oge, ịmụta inwe ọrụ m ga na-arụ mgbe niile adịghịrị m mfe.

Ndụmọdụ ahụ dị na Diuterọnọmi 6:5-7, bụ́ nke gwara ndị mụrụ ụmụ ka ha na-akụziri ụmụ ha banyere Chineke, nyekwaara m aka. Aghọtara m na m ga-aza Chineke ajụjụ banyere otú m si zụọ ụmụ m abụọ. Nke ahụ kpaliri m iwepụtawakwu oge mụ na ha ga-eji na-anọ nakwa ịmụta ịhụ ha n’anya otú m kwesịrị.

Ana m ekele nnọọ Jehova na o kwere ka m mụta eziokwu banyere ya. N’ihi ya, m kpebiri inyefe ya ndụ m ma kwe ka e mee m baptizim dị ka Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: Ebe m mụtara ịchịkwa iwe ọkụ m, mụ na nne m dịkwuru ná mma. Mụ na ụmụ m dịkwukwara ná mma.

Ebe ọ bụ na m kpọọla ihe ndị na-adịghị Chineke mma asị, ọtụtụ nsogbu ndị ndụ m biri na mbụ kpatara akwụsịla. M na-enweta ezigbo obi ụtọ ugbu a n’inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu banyere Chineke anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova.

‘Echere m na Baịbụl zọrọ ndụ m.’—MINORU TAKEDA

ADỊ M AFỌ: 54

ABỤ M ONYE: JAPAN

NDỤ M BIRI: EBIRI M N’OKPORO ÁMÁ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Mụ na nna m na nne nne m bi n’obodo Yamaguchi ka m na-etolite. Amaghị m nne m. Mgbe m dị afọ iri na itoolu, nne nne m nwụrụ, mụ na nna m ebirikwa gawa. Abụ m osi ite, nna m na-arụkwa ọrụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta ihe oriri. Oge ọrụ anyị dị iche, n’ihi ya, ọ na-esi ike anyị ahụ ibe anyị. Amalitere m ịrụ ọrụ ogologo oge na iso ndị enyi m aṅụ mmanya.

Ka oge na-aga, ọrụ m gbụrụ m. Mụ na onyeisi ọrụ m sere okwu, mụ amalitekwa ịṅụkwu oké mmanya. Ka e mechara, mgbe ọ fọrọ obere ka m gbaa afọ iri atọ, ekpebiri m ịhapụ ụlọ ma mee njem. Mgbe ego m gwụrụ, amalitere m ịrụ ọrụ n’ebe a na-agba chaa chaa. Amatara m otu nwa agbọghọ, anyị lụkwara. Ma anyị gbasara mgbe anyị lụsịrị naanị afọ abụọ na ọkara.

Obi dara m mbà, ike ụwa agwụkwa m, mụ emechaakwa daba n’oké ụgwọ. Agbanahụrụ m ndị m ji ụgwọ ma binyere nna m ruo oge ụfọdụ n’obodo anyị, ma, aghaara m ya ụgha ma mebie mmekọrịta mụ na ya. Eweere m ego n’ụlọ ya ma jiri chaa chaa m na-agba kpaa afọ m ruo oge ụfọdụ. Emechara m daa ogbenye ma bitụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Akwagara m Hakata, si na ya kwaga Himeji, mechaakwa kwaga Kioto. Ebiri m n’okporo ámá ruo afọ ole na ole.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 1999, anọ m n’otu ogige ntụrụndụ dị nso n’Osimiri Kamogawa dị na Kioto mgbe ụmụ nwaanyị abụọ bịakwutere m. Otu n’ime ha jụrụ m, sị, “Ọ̀ ga-amasị gị ịmụ Baịbụl?” Ekwetara m. Ndị Kraịst tozuru okè nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ mụụrụ m Baịbụl ma nyere m aka ịhụ mkpa ọ dị ịgbaso ụkpụrụ Baịbụl. Ha tụụrụ m aro ka m chọta ọrụ na ụlọ. Iji mee ha obi ụtọ, achọrọ m ọrụ n’ebe ole na ole, ma, na mbụ, agbasighị m mbọ ike. Ma, ka e mechara, amalitere m ikpe ekpere maka enyemaka ma chọsiwe ọrụ ike, emechakwara m nweta ọrụ.

Ekpere nyekwaara m aka imeri otu ọnwụnwa siri ezigbo ike. Ndị ahụ m ji ụgwọ m gbaara ọsọ jidere m ma gwa m ka m kwụọ ha ụgwọ ha. Ọ kpataara m nnọọ nchekasị. N’ọgụgụ Baịbụl m na-agụ kwa ụbọchị, m gụziri ihe e dere n’Aịzaya 41:10. N’amaokwu ahụ, Chineke kwere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi nkwa, sị: “M ga-enyere gị aka.” Nkwa ahụ gbara m ume ma mee ka obi sie m ike. M gbasiri mbọ ike ma mechaa kwụọ ụgwọ m ji. N’afọ 2000, eruru m eru ka e mee m baptizim dị ka Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: Ihe m mụtara na Baịbụl kpaliri m ịgbalị imezi mmekọrịta mụ na nna m, ọ gbaghakwaara m omume ọjọọ m mere n’oge gara aga. Obi tọrọ ya ụtọ na mụ amụtala ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Baịbụl. Echere m na ịmalite ịgbaso ụkpụrụ Baịbụl zọrọ ndụ m.

Ọzọkwa, m na-arụli ọrụ ugbu a iji nweta ego m ji elekọta onwe m. (Ndị Efesọs 4:28; 2 Ndị Tesalonaịka 3:12) Enwetakwara m ezi ndị enyi n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Mak 10:29, 30) Eji m obi m niile na-ekele Jehova maka ihe ndị ọ kụziiri m.

“Ọ dịrịghị m mfe ime mgbanwe ndị m kwesịrị ime.”—DAVID HUDSON

ADỊ M AFỌ: 72

ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE NA-AṄỤ OKÉ MMANYA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Abụ m nwa nke iri na otu nne na nna m, bụ́ Lucy na Willie, mụrụ. Ezinụlọ anyị biri n’ógbè ndị nwe ala Ọstrelia a na-akpọ Ọrukụn, nke dị n’ime ime ebe ugwu obodo Kwinsland. Ọrukụn dị n’akụkụ Osimiri Acha mara ezigbo mma, bụ́ nke dịdebere otu oké osimiri. Nne na nna m kụziiri anyị bụ́ ụmụaka iji ịchụ nta na igbu azụ̀ akpa afọ anyị. N’oge ahụ, gọọmenti machibidoro anyị ndị nwe obodo Ọstrelia iji ego n’aka, ọ bụkwa naanị n’ebe e nyere anyị ka anyị nwere ike ibi.

Nne na nna m nwara ike ha ịkụziri m àgwà ọma ma kụziere ụmụ ha niile ịkwanyere ndị agadi n’obodo anyị ùgwù na ikerịta obere ihe ọ bụla anyị nwere. N’ihi ya, anyị lere ndị agadi niile anya dị ka nne na nna anyị na ndị deede na daada anyị.

Nna m nwụrụ mgbe m dị afọ asaa, anyị kwagakwara n’ogige ụlọ chọọchị nke ndị nwe obodo Ọstrelia dị na Mapun, bụ́ ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise n’ebe ugwu Ọrukụn. Mgbe m dị afọ iri na abụọ, amalitere m ịmụ otú e si achị ịnyịnya na ehi, arụkwara m ọrụ n’ọtụtụ ebe a na-azụ ehi dị ka onye na-achị ehi ruo mgbe ọ fọrọ obere ka m gbaa afọ iri ise. Ọrụ ahụ adịghị mfe. M na-aṅụ oké mmanya mgbe mgbe. Nke ahụ kpataara m isi ọwụwa na ihe isi ike mgbe mgbe.

N’otu n’ime oge ndị m ṅụrụ oké mmanya, m ji anya mmanya si na họtel pụta dabara ụgbọala ji ọsọ na-agbafe. M nọrọ n’ebe a na-agwọ ọrịa na ebe a na-akụziri ndị ọrịa imega ahụ́ ruo afọ abụọ—ọ bụkwa otú ahụ ka ọrụ ịchị ehi m si kwụsị.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’oge ahụ a na-agwọ m, otu enyi m nwaanyị wetaara m magazin Ụlọ Nche na Teta! ka m gụọ. Ma, agachaghị m akwụkwọ, n’ihi ya, anaghị m agụ ihe nke ọma. Otu ụbọchị anwụ na-achasi ike, otu nwa amadị dị afọ iri asatọ na atọ bịaziri na nke m. M sịrị ya bata bịa ṅụọ mmiri jụrụ oyi. O nyere m akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Baịbụl ma jụọ m ma yà nwere ike ịlọghachi kọwaara m ihe ndị dị na ha. Anyị mechara malite ịmụchi Baịbụl anya. M malitere ịhụ na ọ dị m mkpa ịgbanwe àgwà ụfọdụ m na-akpa na otú m si ebi ndụ ma ọ bụrụ na m ga-eme ihe dị Chineke mma.

Ọ dịrịghị m mfe ime mgbanwe ndị m kwesịrị ime. Ma n’ihi ihe nne m kụziiri m, m na-akwanyere agadi nwoke ahụ na-akụziri m Baịbụl ezigbo ùgwù ma jiri ihe ime mmụọ ọ na-akụziri m kpọrọ ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, enyefeghị m Chineke ndụ m ozugbo. M chere na m kwesịrị ịma ihe niile e dere na Baịbụl.

Otu onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nyeziiri m aka ịgbanwe echiche m na nke a. Ọ bụ Onyeàmà Jehova, ọ gwakwara m ka m gụọ agbamume dị ná Ndị Kọlọsi 1:9, 10. Ebe ahụ kwuru na anyị kwesịrị ịnọgide“na-enwekwu ezi ihe ọmụma nke Chineke.” Onye ahụ mụ na ya na-arụkọ ọrụ nyeere m aka ịghọta na m ga na-amụta ihe ọhụrụ mgbe niile, n’ihi ya, e nweghị nnọọ ihe mere m ga-eji hapụ ịga n’ihu maka na amụtabeghị m ihe niile.

Obi kacha tọọ m ụtọ mgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova. M ji anya m abụọ hụ ka ndị si n’agbụrụ dị iche iche na-efe Chineke n’ịdị n’otu. Ịdị n’otu ahụ mere ka o doo m anya na achọtala m ezi okpukpe ahụ, n’ihi ya, n’afọ 1985, e mere m baptizim dị ka Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: M mụtakwuola ịgụ ihe nke ọma, m na-ejikwa ọtụtụ awa kwa izu enyere ndị ọzọ aka ịmụta ịgụ na ịmụ Baịbụl. Ihe ọzọ bụ na enyi m nwaanyị ahụ bụ́ onye mbụ nyere m magazin Ụlọ Nche na Teta! ka m gụọ na Ndịàmà mụwakwara Baịbụl, e mee ya baptizim, ọ bụkwa ezigbo nwunye m ugbu a. Mụ na ya na-enweta ezi ọṅụ n’inyere ndị ọzọ bi n’ógbè ndị nwe obodo Ọstrelia aka ịmụta banyere Jehova Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Mụ na nwunye m na-enweta ezi ọṅụ n’inyere ndị ọzọ bi n’ógbè ndị nwe obodo Ọstrelia aka ịmụta banyere Chineke