Abụ Ọma 13:1-6

  • Devid tụrụ anya ka Jehova zọpụta ya

    • “Jehova, ruo ole mgbe?” (1, 2)

    • Jehova na-eji ọtụtụ ihe ọma akwụ mmadụ ụgwọ (6)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 13  Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-echefu m? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi? Olee mgbe ị ga-akwụsị izoro m ihu gị?+   Olee mgbe m* ga-akwụsị ichegbu onwe m,Kwụsịkwa iru uju kwa ụbọchị? Olee mgbe onye iro m ga-akwụsị imeri m?+   Jehova Chineke m, biko, lee m anya za m. Mee ka anya m hụ ụzọ, ka m wee ghara ịnwụ,*   Ka onye iro m ghara ịsị: “Emeriela m ya.” Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ maka na m dara.+   M tụkwasịrị ịhụnanya gị* obi.+ Obi ga-atọ m ụtọ maka na ị na-azọpụta m.+   M ga-abụku Jehova abụ n’ihi na o jirila ọtụtụ ihe ọma kwụọ m ụgwọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “ihi ụra ọnwụ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”