Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Ji Ata Ahụhụ, Na-aka Nká, Na-anwụkwa Anwụ?

Gịnị Mere Anyị Ji Ata Ahụhụ, Na-aka Nká, Na-anwụkwa Anwụ?

Chineke weere anyị ka ụmụ ya. N’ihi ya, ọ chọghị ka anyị na-ata ahụhụ. Ma, ahụhụ juru ebe niile taa. Gịnị mere o ji dị otú a?

Nne na Nna Anyị Mbụ Kpataara Anyị Ahụhụ

“Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile.”​—NDỊ ROM 5:12.

Mgbe Chineke kere nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv, ha zuru okè. Ma echiche ha ma ahụ́ ha zuru okè. O nyekwara ha ebe mara mma a na-akpọ ogige Iden ka ha biri na ya. Ọ gwara ha na ha nwere ike iri mkpụrụ osisi ọ bụla dị n’ogige ahụ, e wepụ otu. Ma, Adam na Iv kpebiri iri mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila. Ihe ahụ ha mere bụ mmehie. (Jenesis 2:​15-17; 3:​1-19) Mgbe ha mehiechara, Chineke chụpụrụ ha n’ogige ahụ, ihe amalitezie siwere ha ike. Ha mechara mụta ụmụ, ihe esiwekwara ụmụ ha ike. Ma ha ma ụmụ ha mechara kaa nká ma nwụọ. (Jenesis 3:23; 5:5) Ihe mere anyị ji aka nká, na-ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ bụ n’ihi na anyị bụ ụmụ Adam na Iv.

Ndị Mmụọ Ọjọọ So Eme Ka Anyị Na-ata Ahụhụ

“Ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.”​—1 JỌN 5:19.

“Ajọ onye ahụ” bụ Ekwensu. Ọ bụbu mmụọ ozi. Ma o mechara nupụrụ Chineke isi. (Jọn 8:44; Mkpughe 12:9) E nwekwara ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sonyeere Ekwensu. A na-akpọ ha ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-eji ike ha eduhie ndị mmadụ ka ha na-enupụrụ Chineke isi. Ha na-emekwa ka ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ. (Abụ Ọma 106:​35-38; 1 Timoti 4:1) Ọ na-atọ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ụtọ ime ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma na-ahụsi anya.

Anyịnwa Na-eji Aka Anyị Akpatara Onwe Anyị Ahụhụ Mgbe Ụfọdụ

“Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.”​—NDỊ GALESHIA 6:7.

Ọtụtụ ahụhụ anyị na-ata bụ n’ihi mmehie anyị ketara n’aka Adam na Iv, nakwa n’ihi ike Ekwensu na-akpa n’ụwa. Ma mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eji aka ha akpatakwuru onwe ha ahụhụ. Olee otú ha si eme ya? Ha mee ihe ọjọọ ma ọ bụ mee mkpebi na-adịghị mma, ha na-aghọrọkarị mkpụrụ ọjọọ si na ya. Ma ndị mere ihe ọma, na-aghọrọ mkpụrụ ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwoke ana-akwụwa aka ya ọtọ, na-agbasi mbọ ike, hụkwa nwunye ya na ụmụ ya n’anya, ọ ga-aghọrọ ọtụtụ mkpụrụ ọma, ezinụlọ ya ga na-enwekwa obi ụtọ. Ma, nwoke na-agba chaa chaa, na-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ dịrị umengwụ ga-eme ka ya na ezinụlọ ya daa ogbenye. N’ihi ya, anyị kwesịrị ige Chineke ntị. Ọ chọrọ ka anyị ghọrọ ọtụtụ mkpụrụ ọma, nke “udo” so na ya.​—Abụ Ọma 119:165.

Anyị Bi ‘n’Oge Ikpeazụ’

‘N’oge ikpeazụ . . . , ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, . . . ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị.’​—2 TIMOTI 3:​1-5.

Taa, ọtụtụ ndị na-eme ihe ndị a e buru n’amụma. Ihe a ndị mmadụ na-eme na-egosi n’eziokwu na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ’ nke ụwa a. Akwụkwọ Nsọ kwukwara na ihe ndị ọzọ a ga-eji mara oge ikpeazụ a bụ agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa. (Matiu 24:​3, 7, 8; Luk 21:​10, 11) Ihe ndị a na-akpatara ndị mmadụ ahụhụ na ọnwụ.