Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Chineke kwere nkwa na ihe niile ga-adị mma n’oge na-adịghị anya. Ọ ga-eme ka ahụhụ kwụsị, meekwa ka ndụ na-atọ mmadụ niile ụtọ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:11) Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na nkwa a ga-emezu? Ọ bụ n’ihi na “Chineke abụghị mmadụ nkịtị nke na-agha ụgha.” (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) Lee ihe ụfọdụ Chineke ga-eme.

Chineke Ga-ebibi Ndị Ajọ Omume

“Mgbe ndị ajọ omume na-eju ebe niile otú ahịhịa si epu ebe niile, ihe ana-agazikwara ndị niile na-eme ihe ọjọọ, ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”​—ABỤ ỌMA 92:7.

Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ihe na-akakwu njọ n’ụwa a. Ma, o kwesịghị iju anyị anya. A sị ka e kwuwe, Baịbụl bu ụzọ kwuo na 2 Timoti 3:​1-5 na ọ ga-adị otú a. Ọ sịrị na ndị mmadụ ga na-akpa àgwà ndị jọgburu onwe ha ‘n’oge ikpeazụ.’ Oge ikpeazụ nke gịnị? Nke ụwa a ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke juru na ya. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi ndị niile na-achọghị isepụ aka n’ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe ahụ, ọ bụ naanị ndị ezi mmadụ, ya bụ, ndị na-asọpụrụ Chineke, ga-afọdụ. “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 37:29.

Chineke Ga-ebibi Ekwensu

“Chineke, onye na-eme ka anyị nwee udo, ga-azọpịa Setan.”​—NDỊ ROM 16:20.

E bibichaa ndị ọjọọ niile, ma Ekwensu ma ndị mmụọ ọjọọ ya, udo ga-adịzi n’ebe niile n’ụwa. Chineke kwere nkwa, sị: ‘E nweghị onye ga-emenye gị ụjọ.’​—Maịka 4:4.

Chineke Ga-eme Ka Ọnwụ na Ọrịa Kwụsị

“Ụlọikwuu nke Chineke dị ebe ụmụ mmadụ nọ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”​—MKPUGHE 21:​3, 4.

Ahụhụ na ọrịa ga-akwụsị n’ihi na Chineke ga-edozi nsogbu niile Ekwensu, Adam, Iv, na ezughị okè kpatara. Ihe a ga-emedị ka ‘ọnwụ gharazie ịdị.’ Ụmụ mmadụ ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-erubere ya isi ga-adị ndụ ebighị ebi. Ma, olee ebe ha ga-ebi?

Chineke Ga-eme Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs

“Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”​—AỊZAYA 35:1.

Chineke bibichaa ndị ọjọọ niile, ụwa ga-aghọ Paradaịs. A ga-enwe ọtụtụ ogige ndị mara mma na ya, nri ga-ejukwa ebe niile. (Abụ Ọma 72:16) Oké osimiri dị iche iche, ọdọ mmiri dị iche iche, na osimiri dị iche iche ga-adị ọcha, ihe ndị dị ndụ ga-ejukwa n’ime ha. N’oge ahụ, o nwere ike o nweghịzi ebe ị ga na-anụ okwu bụ́ “imebi ikuku” ma ọ bụ “imebi mmiri.” Onye ọ bụla ga-arụ ụlọ nke aka ya, birikwa na ya. O nweghịzi onye ga-anọ n’enweghị ụlọ. Agụụ na ịda ogbenye ga-alakwa kpamkpam.​—Aịzaya 65:​21, 22.

Chineke Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

“Chineke ga-akpọlite ndị . . . nwụrụ anwụ.”​—ỌRỤ NDỊOZI 24:15.

Ị̀ ga-achọ ịhụ ndị nke gị nwụrụ anwụ ọzọ? Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ ọzọ n’ụwa a n’ime Paradaịs. Ị ga-amata ha, hanwa ga-amatakwa gị. Chegodị ụdị obi ụtọ unu niile ga-enwe mgbe ahụ. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ihe a ga-eme? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl kwuru banyere ndị toro eto na ụmụaka a kpọlitere n’ọnwụ, ha na ndị ezinụlọ ha ebirikwa ọzọ. Ọtụtụ mgbe, Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ n’ihu ọtụtụ ndị.​—Luk 8:​49-56; Jọn 11:​11-14, 38-44.