Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Banyere Chineke Na-eme Ka Anyị Chọwa Ịbụ Enyi Ya

Ịmata Banyere Chineke Na-eme Ka Anyị Chọwa Ịbụ Enyi Ya

Ọ bụghị naanị na Chineke nwere ike dị ukwuu, kama, o nwekwara ọtụtụ ọmarịcha àgwà ndị ọzọ. Ọ chọrọ ka anyị mata banyere ya ma bịaruo ya nso. (Jọn 17:3; Jems 4:8) Ọ bụ ya mere o ji kọọrọ anyị ọtụtụ ihe banyere onwe ya.

Chineke Nwere Aha

“Ka ndị mmadụ mara na aha gị bụ Jehova nakwa na ọ bụ naanị gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.”​—ABỤ ỌMA 83:18.

Baịbụl na-akụzi na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke. Ọ bụ ya kere eluigwe na ụwa nakwa ihe niile dị ndụ. Ọ bụkwa naanị ya ka anyị kwesịrị ife.​—Mkpughe 4:11.

Jehova Bụ Chineke Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

“Chineke bụ ịhụnanya.”​—1 JỌN 4:8.

Jehova ejirila Baịbụl na ihe ndị o kere eke mee ka anyị mata banyere ọtụtụ n’ime àgwà ya. Ịhụnanya bụ àgwà ya kachanụ. Ihe niile ọ na-eme gbakwasịrị ụkwụ n’ịhụnanya. Ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova, ka anyị ga na-ahụkwu ya n’anya.

Jehova Bụ Chineke Na-agbaghara Mmehie

“Ị bụ Chineke dị njikere ịgbaghara mmehie.”​—NEHEMAYA 9:17.

Jehova ma na anyị ezughị okè. N’ihi ya, ọ “dị njikere ịgbaghara” anyị. Anyị rịọ ya mgbaghara ma gbalịsie ike sepụ aka n’ime ihe ọjọọ, ọ ga-agbaghara anyị. Ọ gaghịkwa ata anyị ahụhụ maka mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga.​—Abụ Ọma 103:​12, 13.

Jehova Chọrọ Ka Anyị Na-akọrọ Ya Obi Anyị n’Ekpere

“Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso . . . Ọ na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka.”​—ABỤ ỌMA 145:​18, 19.

Jehova achọghị ka anyị na-emere ya omenala ụfọdụ pụrụ iche ma ọ bụ jiri ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ ihe e sere ese na-efe ya ofufe. Ọ na-ege ntị n’arịrịọ anyị na-arịọ ya otú ahụ ezigbo nne na nna si ege nwa ha ha hụrụ n’anya ntị.